Lai Mohammed : Ọ bụghị eziokwu na gọọmenti etiti enweghị ihe o mere n'ala Igbo

Lai Mohammed Image copyright @Mohammed_Lai

N'okwu ya oge ọ gara nkuzi maka ndị ahọpụtara ga-agbara Muhammadu Buhari mbo ịzọ ọchịchị ọzọ n'okpuru ọchịchị ime obodo dị na Kwara steeti.

Lai mohammed gọrọ n'ebubo ndị gọvana ọwụwanyawụ boro na ọchịchị nọ ugbua gbakụtara Ndigbo azụ, sị na mpaghara ọbụla nwere ihe ha ketara n'ọrụ ọchịchị Muhammadu Buhari na-arụ.

O kwuru na ha ga-edepụta ọrụ dị 69 nke gọọmenti etiti ji n'aka n'ala Igbo, o kwuru na dịka ndị mpaghara ndị ọzọ, Ọwụwanyanwụ Naịjirịa nwetara ego karịrị ijeri naịra iri na isii (N16.6 Bn) site n'ego mbite Sukuk.

Ọrụ ndị eji n'aka dị n'ego Sukuk gụnyere akwammiri Naịja nke abụọ, okporoụzọ awarawa sị Ọnicha gawa Enugwu, nke si Enugwu gawa Pọtakọtụ nakwa akụkụ ya nke sị Aba gawa Pọtakọtụ.

O kwuru n'ezie na ọchịchị ndị gara aga emeghị Ndị Igbo nke ọma n'ihe gbasara iwu ụzọ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

" Ọ bụrụ na ha mere ya, o nweghị onye ga na-atụ arịrị ugbua."

ọ gara n'ihu sị, " Ọ dị mma ị sị ka e mee karịa mana ọ dịghị mma ị sị na onwebeghị ihe e mere."

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a