Kedụ ego ole Naịjirịa reterela na mmanụ agbidi?

ite mmanụ agbịdị Image copyright Getty Images

Naịjirịa eretela ihe karịrị ijeri dọlla 26 ($26bn) nke pụtara tarị naịra 7.93 (N7.93 tn) n'ọnwa asaa nke mere ya mba nke isii kachasị enweta ego na mmanụ n'otu mba na-ere mmanụ a kpọrọ 'Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC) na bekee.

Naịjirịa nwetara pasent 6.24 n'ime ijeri dọla 417 nke pụtara tarị naịra 127.2 ego otu OPEC retara na mmanụ agbịdị n'ọnwa asaa.

Angola sochiri Naịjirịa n'Afrịka dịka ha nwetara ijeri dọla iri abụọ na otu, nke pụtara tarị naịra isii na ọma (6.41).

Ihe ndị a dị n'ozi ka ihe si kwụrụ n'otu OPEC nke sị n'aka ngalaba Amerịka na-ewepụta ozi banyere okwu mmanụ a kpọrọ 'US Energy Information Administration (EIA).

N'ozi ahụ, mba Saudi Arabia nwetara ego kachasị n'ire mmanụ dịka ego ha ruru ijeri dọla otu narị na iri abụọ na isii (126) nke pụtarea tarị naịra iri atọ na asatọ na ọma (38.4).

N'aka nke ọzọ, mba Ekwitorial Gini na Ekụadọ nwetara ego pekarịchara mpe.

A na-ele anya na site n'ọnwa ọctọba, mmanụ Naịjirịa na-ebupụ ga-agbalite rụọ kago iri atọ na asatọ dịka a na-ele anya i na-ebupu ite mmanụ agbịdị (barrel) nde 1.12 (1.12 million.).

Akụkọ ga-amasị gị: