Lee nwoke kwuru na ọ na-aha mmiri n'ala Igbo

Onye na-aha mmiri
Nkenke aha onyonyo "Aha m bụ Godwin Onasedu onye a ma dịka Ụmụnnanwaezuakụ nke mbụ n'Ifitedunu"

"O nwere mgbe ụjọ tụrụ gị na mmiri nwekwara ike ghara izo dịka anyị nọ ebe a na-eche?" ka BBC jụrụ ya.

O weliri anya elu nwayọ nwayọ ka olu a na-anyị ya arụ, tụọ aka n'obi ya kwuo sị "Mụ? Ka ị na-ala taa, mmiri ozuzo ga na-achụ gị ọsọ."

Ka anyị mechara si Ọka na-alaghachị Enugwu na mgbede ahụ, nnukwu mmiri malitere zowe. O zoro nnukwu mere na ọ fọrọ obere ka anyị kwụsị ụgbọala anyị n'ụzọ.

O zogidere ruo mgbe anyị garuru Enugwu.

Ịchọta onye na-aha mmiri

Nkenke aha onyonyo Onasedu nwere ụlọarụsị abụọ; otu nke dị n'ụlọ ya na ọzọ dị n'obere ọhịa dị n'akụkụ ụlọ ya

Ọ bụghị taa ka akụkọ bidoro ịgagharị na e nwere ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-aha mmiri.

Ndị mmadụ na-ekwu na ndị a na-aha mmiri na-akpa ike ọfụma, ma na-eme ka mmiri zoo maọbụ ghara izo.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na enweghị onye nwere ikike iji ihuigwe mee ihe masịrị ya ọkachasị ime ka mmiri zoo; na ọ bụ aghụghọ.

Ndị ụlọọrụ 'Nigerian Metrological Agency' bụ ndị ọkachamara gbasara ụdịrị ihe a na Naịjirịa kwuru sị na enweghị onye nwere ike ime ụdịrị ihe a.

Nkenke aha onyonyo O ji kandụlụ ọcha nakwa nke edo edo oge ọ na-akpọku mmiri

Ọtụtụ ndị na-aha mmiri juru na Naịjirịa. Ha na-eji ịha mmiri n'emume dịka akwamozu, ụbọchị ncheta ọmụmụ nakwa ndị ọzọ akpa ego.

Ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ndị mmadụ na-akpọku ndị na-aha mmiri ka ha jiri mmiri mebie emume onye iro ha na-eme.

O were BBC ọnwa anọ ịchọta Godwin Onasedu bụ onye na-aha mmiri n'obodo Ifitedunu dị n'okpuruọchịchị Dunukọfịa n'Anambara steeti, kwere ka anyị maa ya aka ịma ma ọ bụ eziokwu na ọ ga-emenwu ka mmiri zoo.

Onasedu kwuru na e ji ịha mmiri mara ezinaụlọ ya kemgbe ọgụ afọ.

Ihe e ji aha mmiri

Iji mee ka mmiri gbadata, o kwuru ka anyị weta ihe ndị dịka:

  • Kreeti mmanya biya abụọ
  • Otu karama kaịkaị 501
  • Mkpụrụ ọjị anọ
  • Puku naịra a ga-eji awa ọjị
  • Kandụlụ, akwa ọcha nakwa nke ọbaraọbara maka ụbọchị ahụ.

Ụbọchị akara aka

Nkenke aha onyonyo O kwuru sị na o gosiri ndị mmadụ ike ya na 1972 ka o jidere mmiri n'otu ọdọ ụgbọelu

Anyị zutere ya n'ihu ụlọ ya ka ọ na-akpọ ahịhịa ọkụ, sị na ọ na-achụ mmiri ozuzo, n'ụbọchị Ọgọst 17, 2018.

O kwuru sị "e nwere ndị na-eme akwamozu nyere m ọrụ ka m jidere ha mmiri, mana ebe ọ bụ na ị chọrọ ịnwa ike m, aga m ewedata obere mmiri ozuzo na-agaghị ezote aka."

Anyị nyere ya ihe ndị ọ sị anyị weta maka ịchụ mmiri, ọ gwara onye na-enyere ya aka ka ọ wụnyụọ ọkụ aha ka a gaa mezuo nke fọrọ afọ n'ụlọarụsị.

Site n'ihe o kwuru, ọkụ ọ na-amụ na-achụpụ mmiri ozuzo ahụ; ọkụ ahụ kwụsị ire, mmiri ga-ebido izo.

Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị obodo gbakọrọ ịhụ ihe ọ chọrọ ime

N'agbanyeghị na ọ bụ oge udummiri ka a nọ, anwụ nọ na-acha ụbọchị ahụ, mana oge anyị nyochara ihe Google nwere ikwu maka mmiri izo ụbọchị ahụ, o kwuru na mmiri ga-emecha zoo ụbọchị ahụ.

Ndị obodo nụrụ maka ihe chọrọ ime gbakọrọ sowe anyị; nne, ndị nne, ndị nna ma ụmụaka so anyị n'azụ ka Onasedu yi uwe ọcha n'ahụ nakwa n'isi du anyị na-aga.

Ụlọarụsị ya bụ osisi abụọ toro ezigbote ogologo ekere ụdọ nakwa akwa na-acha edo edo nakwa ọbara ọbara.

Karama kaịkaị dịbu n'ime ya nakwa ihe ndị ọzọ anyị amaghị tọgbọcha n'ala ebe ahụ.

Nkenke aha onyonyo Mmiri ebidoghị izo ozugbo

Ọ malitere ịkụ ogene ya nakwa ịkpọku mmiri ihe ruru nkeji 45 mana mmiri ezoghị, ndị mmadụ malitere ịlaghachị ụlọ ha ka ọ kwụsịrị.

Ọtụtụ ihe mere n'ime awa abụọ anyị nyere ya ịha mmiri, dịka otu onye isi na-adịchaghị mma gara n'ụlọ bido ọkụ ahụ a wụnyụrụ, nke onye na-enyere Onasedu aka kwuru kpatara mmiri ezoghị.

Mmiri bidoro izo obere obere, gbanwee ihu igwe.

O zoro naanị nkeji ise tupu ọ kwụsị. Mmiri ahụ ezosịghị ike, mana ọ bụ ụdịrị nke na-eme ka ala dịrị mmiri mmiri.

Ndị mmadụ ga-ekweta ihe ha ga-ekweta, mana ihe anyị ma bụ na mmiri zoro n'ezie.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a