Atọghapụla ụmụnwaanyị IPOB n'Owere

Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa. Image copyright Sam Amadi
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa.

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na atọghapụla ụmụnwaanyị IPOB anwụchiri n'owerre n'izuụka gara aga maka ngagharị iwe ka atọghapụ Nnamdi Kanu.

Otu onye ọkaiwu nọ ebe ihe a mere kwuru na ọbụ ụlọịkpe n'Owerre nyere iwu ka atọghapụ ụmụnwaanyị ahụ.

Ndị Amnesty International tịnyere ọnụ n'okwu a ụnyaahụ mgbe ha boro gọọmentị Naịjirịa ebubo ị nwụchi ya bụ ụmụnwaanyị n'ụzọ ezighi ezi.

Kingsley Moghalu bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, gara n'ụlọ mkpọrọ ebe e ji ụmụnwaanyị a n'Owere, tinyere ọnụ ya n'elu Twitter.

O kwuru sị na onye ọbụla kwesịrị inwe ikike ime maọbụ ikwu ihe masịrị ya na Naịjirịa.

N'otu aka ahụ, Sam Amadi bụ otu na-onye azọ ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti n'afọ 2019, tinyere ọnụ n'okwu a sị:

"O meela! Ndị nne anyị na ụmụnne ụmụnwaanyị anyị apụtala."

Cheta na Amadi so na ndị gara n'ụlọ mkpọrọ ịhụ na a tọghapụrụ ụmụnwaanyị a.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a