Otu ụlọikpe na mba Zimbabwe ekwuola n'onyeisiala Mnangagwa nwe mmeri

Akụkọ dị mkpa:

Image copyright AFP

Otu ụlọịkpe na mba Zimbabwe akwadola mmeri Onyeisiala ahụ bụ Emmerson Mnangagwa meriri na ntuliaka ha mere n'ọnwa Julai afọ a.

Otu ndọrọndọrọ ibe ha kpụpụrụ ha ụlọịkpe maka ebubuo iji nrụrụaka merie ya bụ ntụliaka mana onye ọkaikpe kagburu ya bụ ikpe na-ekwu na o nweghi ihe aka ebe kwadoro ya bụ ebubo.

Okwu IPOB

Ọṅụ na obi aṅụrị na-ewu n'Owere ugbua makana ụlọikpe enyela iwu ka atọghapụ ụmụnwaanyị karịrị otu narị bụ ndị mere ngagharị iwe n'ihi mnwereonwe Nnamdi Kanu.

Sam Amadi, Kingsley Moghalu na otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Amnesty International tinyere ọnụ na ya bụ okwu na-akatọ nwụchi anwụchiri ụmụnwaanyị ahụ.

Tupu atọghapụ ha, okwu ha wuru ewu na soshal midia dịka ndị mmadụ niile ọ kachasị ndị ntorobia pụtara ịzọ oke ha na-ekwu na mmadụ ime ngagharị iwe adaghị iwu Naịjirịa a kpọrọ 'Constitutio n' na Bekee

Ndị ọzọ na-akatọkwa onye ọkaipe sepụrụ aka na ya bụ okwu na-ekwu na o metaghị ya.

Na mba ofesi

Image copyright Getty Images

Ezinaụlọ sinetọ zọburu ọkwa ọchịchị na mba Amerịka bụ John McCain ekwuola na ọ ga-akwụsị ọgwụgwọ ọ na-anata maka ọrịa akpụ nke ụbụrụ ọ na-arịa.

Akụkọ pụtara na ọ na-arịa ọrịa akpụ n'afọ gara aga nakwa kemgbe ahụ ọ na-anata ọgwụgwụ maka ya bụ ihe.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

E bola Hugo Lloris bụ onye ndu nakwa onye nche bọọlụ otu egwuregwu Tottenham ebubo ịkwọ ụgbọala ebe mmanya na-egbu ya.

Ndị uweojii na mba Briten ekwuola na a ga-akpụpụ ya ụlọịkpe n'ụbọchị iri na otu nke Septemba.

Okwu a na-ewusi ike na soshal midia ka akụkọ a na-ewu.

Gee Nkeji nke mgbede a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ka emechichara akwammiri Third Mainland n'abalị ụnyaahụ, ndị na-aga ọrụ na ahịa gwara BBC Igbo ihe ha hụrụ tụpụ ha eruo ụlọọrụ ha.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Anyị hụsiri anya taa ka anyị na-eje ọrụ'