N' Enugwu ndị ntaakụkọ agwala gọọmenti ka ọghara ịdị na emegbu ha

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị ntaakụkọ nọ n'Enugwu steeti agwala gọọmenti ka ọ ghara imegbu ha.

Ndị ntaakụkọ niile ji Enugwu mere ọnụdụ ezukọtala soro ndị Ogbo ha na Naịjiria mee ngagharịiwe maka mmegbu a na-emegbu ha.

Onyeisi ndị otu NUJ n'Enugwu bụ Rex Eze kwara arịrị na ndị uweojii, DSS na ndị ọzọ na etikarị ndị ntaakụkọ ihe ma kpochie ha na nga na eleghị anya n'azụ.

Chris Isiguzo bụ onye na achịkọba NUJ na odịda anyanwụ dọrọ ndị nchekwa na gọọmentị aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n' ofe ma hapụ ndị ntaakụkọ ka ha rụba ọrụ ha.

Isiguzo kwuru na obi adighị ha mma na gọọmentị Oyo state kwaturu ụlọ mgbasa ozị Ayefele na eleghị anya na-azụ.

Onye ntaakụkọ Sun n'Enugwu bụ Ralph Ede kọrọ ka ndị uweojii nke a kpọrọ SARS siri tie ya isi aba okpu, ma kpochie ya n'ụlọ mkpọrọ n'ihi na ya na-arụ ọrụ ya.

Ha bugasị akwụkwọ edepụtara iwe ha were mee ya bụ ngagharịiwe n'Enugwu.

Akụkọ ga-amasị gị: