Emepeela akwammiri Third Mainland

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Akwammiri

Ebe foto si, Getty Images

Emepeela akwammiri third mainland e mechiburu maka inyocha ọnọdụ ya.

Ọchịchị Legọs kelere ndị mmadụ maka ndidi ha nwere n'ime ụbọchị atọ e mechiri akwa ahụ.

N5000 gọọmentị na-akwụ

Ebe foto si, Getty Images

Aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti na-enye ndị nọ n'ụbịam puku naira ise kwa ọnwa.

O kwuru na ọ ga-aka baa uru ma enye ndị ntorobịa otu nde naira iji chọta onwe ha.

Na mba ofesi,

Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ ga-agbasi mbọ ike ịhụ na mba Zimbabwe ga-adịrị mma na-aga n'ihu.

Ebe foto si, AFP

O kwuru nke a ka e duru ya iyi ọrụ dịka onyeisiala mba ahụ taa.

N'egwuregwu,

E bupuru Michael Keane na-agbara Everton bọọlụ ka ọ tawara isi ya oge ya na onye otu ya bụ Idrissa Gueye kụkọtara isi taa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

E bugara Keane ụlọọgwụ ka nkeji isii a na-elekọta ya n'ọgbọ egwuregwu gachara

Ebe Chelsea ji ọkpụ abụọ a satara otu merie Newcastle na St James's Park taa.

Eden Hazard bu ụzọ were penariti nye goolu na nkeji 76, ebe Joselu sara ya na nkeji 83 tupu DeAndre Yedlin bụ onye Newcastle agbakpuo bọọlụ na neetị nke ha na nkeji 87.

Mmeri a pụtara na Chelsea enwetala mmeri atọ n'ime egwuregwu Premier League atọ ha gbarala kamgbe Maurizio Sarri bidoro ịchịkọta ha.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ụkọchukwu Jenny Kenny gwara BBC Igbo na ọ bụ chukwu kpọrọ ya okwu, nke mere ya ji jiri egwu agwọ ọrịa.

Aha onyonyo,

Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia