Ezeife: 'Restructuring ga-eme ka Igbo ga n'ihu karia

Map of Nigeria

Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife ekwuola na ihazigharị Naijiria na mpaghara ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ karịa ịchọ ọkwa onyeisiala.

Okwu Ezeife sochiri oku Igwe Alfred Achebe, Obi Ọnicha kpọrọ ka ahazigharị Naịjirịa ka mpaghara ọbụla gbaba mbọ onwe ha.

N'okwu ya, Ezeife sị "Ọ bụrụ na ekewasia anyị nọrọ be anyị, ọ gaghị enwe onye ya na ibe ya ga na-ese, ndị ọbụla a nọrọ be ha dozie be ha."

Ọ gara n'ihu kọwa na "Anyị nweta ọkwa onyeisiala, ọ chịcha pụọ, anyị etiwekwa mkpu. Mana alaghachi azụ n'ebe anyị nọ na mbụ na 1954 bụ na mpaghara(region) oge Okpara na Awolowo na-achị, ọ bụ oge ahụ enweburu ọchịchị na mpaghara ka Naijiria nwere ọganihu, ọ ga-aka anyị mma."

Cheta na Igwe Achebe kwuru mgbe ọ gara ikele gọvanọ na-achị Plateau steeti bụ Simon Lalong na e kwesiri ịhazịagharị Naịjirịa etu ọ ga-adị ka mpaghara niile nwe ike na-enye onwe ya nri, na abụghị ị na-eche ka gọọmentị etiti nye ha.

Ọ sara ajụjụ maka inye onye Igbo ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 wee si na udiri ihe ahụ abụghị nke dị mkpa.

Igwe Achebe sị na-ekwesịghị ịna ekwu okwu ma onye ga-abu onyeisiala ọ bu onye Igbo, onye Hausa maọbu onye Yoruba, makana ihe kachasị mkpa bụ i hụ na onye banyere n'ọkwa ga-eme onye ka ibe ya.

"Ekweghị m na atụmatụ onyeisiala Igbo, Yoruba maọbụ Hausa. Ọ na-ada ka ihe nkewa; makana ihe anyị chọrọ bụ onyeisiala ndị Naịjirịa họpụtara ka ọ rụọrụ anyi niile ọrụ."

Igwe Achebe sị na ekwesiri ịkewa Naịjirịa n'udi ndị Briten si kewa ya mgbe ha na-achị Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a