Kedụ ebe a nọ mee ntuliaka ọchịchị ime obodo nke Imo steeti?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere na ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti

Na ụbọchị Satọde gọọmentị Imo steeti mere ntuliaka iji nweta ndi ga-abụ ndị isioche n'ọchịchị ime obodo nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka steeti Bekee kpọrọ 'Imo state Independent Electoral Commision (ISIEC)' haziri.

Ụnyaahu bụ ụka, ngalaba ntuliaka ahụ mekwara kpọ ndị meriri, nke pati na-achị steet ahụ bụ APC nwetera mmeri n' ọchịchị ime obodo 27 dị na steeti ahụ.

Mana BBC Igbo gara nyocha ntuliaka ahụ okpuru ọchịchị ime obodo Okigwe were choputa na ọtụtụ ndị mmadụ adịghị njikede maka ntuliaka ahụ.

Ọzọkwa, umunwaanyị na ndị ọzọ na-azụ ahịa pụtara ịtụ mgbere he.

Ndị n'ime ha BBC Igbo gbara ajụju ọnụ jụru ihe ojiri bụrụ na ọ bụ ugbua ka a na-eme ntuliaka a.

Ka ndi ọzọ kwukwara na uche ha adịghị n'ihe na-eme.

Onye ntaakụkọ BBC hụkwara na akwụkwọ ntuliaka adịghị na ọdọ ntuliaka niile ọ gara n'Okigwe.

Cheta na ọtụtụ ndi pati ọzọ n'Imo ekweghị iso mee ntuliaka a.

Lee ihe anyị hụrụ n'elu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara