Ọ bụ olu nwa anyị nọ n'igwe okwu - Ndị nwe Leah Sharibu

Ebe foto si, Reuters
Bụghị ụmụakwụkwọ Dapchi a tọrọ ji ndụ ha lọta
Anụrị bụ ihe nne na nna Leah Sharibu jiri nabata olu ha nụrụ n'ime igwe okwu ụnyaahụ, makana ha sị n'olu ha nụrụ gosiri na nwa ha ka nọ ndụ.
Nna Leah Sharibu gwara BBC na ọ bụ onu nwa ya, bụ otu onye fọrọ n'ime umụaka Dapchi nari na iri ndi omekome Boko Haram kpara aka n'afọ a.
N'ime okwu ahu anụru n'igwe okwu, nwaada Sharibu, bụ onye aka ji kemgbe ọnwa abụo nke afọ a, rịọrọ onyeisiala Naịjirịa ka o mere ya ebere hụ na anapụtara ya n'ime ajọ njem a ọ nọ.

Ebe foto si, Yobe State Government
Ụmụakwụkwọ 76 ka a kpọghachitere
"Obi dị anyi ụtọ, obi dị anyị ụtọ, maka na anyị mazị na nwa anyị dị ndụ," Nna ya kwuru.
Gọọmentị Naịjirịa n'otu aka ahụ kwenyere na uche ha dị na igwe okwu a metụtara Leah Sharibu.
Garba Shehu, bụ onye ndụmọdụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe banyere mgbasa ozi dekwara na ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ya bụ okwu, ma kwuo na onyeisiala ga-eme ihe niile ịhụ na nwa natara n'udo.
Ihe a bụ mbụ anụrụ onu maọbụ hụ Leah Sharibu kemgbe atọọrọ ya na umụakwụkwọ ibe ya na Dapchi.
Ebe ahapụrụ ndị ọzọ, eji Leah maka na okweghi na ọ ga-ahapụ ofufe kraist bụru onye alakuba.
Agaghị m ịlaghachị akwụkwọ - Nwataakwụkwọ Dapchi akpọghachitere

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
