Aka uweojii akaparala umụnwoke ndị ha sị na-eri onwe ha na Legọs

Aka akparala ndi uwejii sị bụ umunwoke na-eri onwe ha

ụmunwoke ji aka
Nkọwa foto,

Iwu Naịjirịa anabataghị mmekọ nwoke na nwoke

Aka akparala ụmụnwoke a sị na-eri ibe ha ebe ha na Legọs. Uweojii sị na ha gbakọrọ na-eme emụme iji nabata ndị ọhụrụ n'Egbeda, Legọs steeti n'ụbọchị ụka gara aga.

Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ndị nche ogbe ahụ gbaara ha ama ebe ndị ụmụnwoke ahụ na-agba oringo n'ime abali.

Ọ bụ onu Leah Sharibu nọ n'ekwe ntị

Ebe foto si, Isaac Linus Abrak

Nkọwa foto,

N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 100

Nne na nna nwaada Leah Sharibu ekwuola na ọ bụ onu ya ka anụrụ n'igwe okwu ezigara ndị ntaakụkọ Cable.

Nna Leah Sharibu gwara BBC na ọ bụ onu nwa ya, bụ otu onye fọrọ n'ime umụaka Dapchi nari na iri ndi omekome Boko Haram kpara aka n'afọ a. O kwuru na obi dị ha anụrị na nwa ha ka dị ndụ.

Ndị mmadụ kpụ Trump n'ọnụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Trump na McCain abughi ọyị mgbe McCain nọ ndụ

N'Amerịka, akatọrọ onyeisiala ha bụ Donald Trump maka ọ chabịrị ugwu ruru Senatọ John McCain. Trump ewetụghị ọkọrọtọ Amerịka ruo mgbe okwesiri.

Trump na McCain ejighi anya ahụ onwe ha mgbe nwoke ahụ dị ndụ.

N'egwuruegwu,

Sloane Stephens ewerela mmeri na malite US Open nke afọ a ebe o ji ọkpụ abụọ merie ogbo ya nke Russia bụ Eveniya Rodina.

Ebe foto si, robertdeutsch-usatodaysports

Nkọwa foto,

Serena bụ Ezenwaanyi na Tenis

N'otu aka ahụ Ezenwaanyị Serena Williams merikwara Magda Linette bụ onye nke ya na ya

kwatara.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị taa

Aha onyonyo,

Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia