Gọọmenti etiti ewepụtala ndepụta ebe ha ji ọrụ n'ọwụwa-anyanwụ

Okporoụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt Image copyright Federal Ministry of Information
Nkenke aha onyonyo Ị hụla akụkụ Okporoụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt nke gọọmenti na - ekwu na ha arụchala?

Gọọmentị etiti site n'aka mịnịstrị na-ahụ maka mgbasa ozi ewepụtala akwụkwọ ndekọ ebe gọọmenti etiti ji ọrụ okporoụzọ nakwa akwammiri n'aka n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.

Cheta n'abali ole na ole gara aga, Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed kwuru na gọọment etiti ji ọrụ gbara ọkpụrụkpụ dị 69 n'aka n'Ọwụwa Anyanwụ, Naijiria.

O kwere nkwa na ha ga-ewpụta aha ebe na ego ole e tinyere n'ọrụ ndị ahụ nke gụnyere Akwammiri Naija nke abụọ, Okporoụzọ sị Enugwu gawa Pọtakọt.

Image copyright @FMICNigeria
Nkenke aha onyonyo Lai Mohammed

Na mmezu ya bụ nkwa, Lai Mohammed kwuru n'akwụkwọ ozi nke mịnịstrị ya wepụtara n'ụbọchị Monde na websait Mịnịstrị ya, o kwuru na ọrụ n'okporoụzọ ndị ahụ kpụrụ ụkwụ n'ala n'ihi ewepụtaghị ezi ego maọbụ ahụghị ego cha cha dịka e nyere ọrụ ngo ọtụtụ ụzọ ndị a tupu ha abanye n'ọchịchị.

Mịnịsta kwuru na okporoụzọ na akwammiri ahụ dị 69 dị na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwụ agbalitela ma nọrọ n'ọnọdụ dị iche iche , site na ego ọchịchị nọ ugbua mapụtara na bọjeti, mbibi Sukuk na ego mmapụta nke ụlọọrụ onyeisiala maka mmepe nke a kpọrọ Presidential Infrastructure Development Fund.

Okporoụzọ ndị ahụ gụnyere ; Okporoụzọ 9th Mile-Enugwu-Pọtakọt, Okporoụzọ Enugwu-Pọtakọt (nke e nyere CCC Construction Nig.

Limited ọrụ ngo ya), nakwa Okporoụzọ Onicha-Enugwu (nke e nyere Niger Construction Limited ọrụ ngo ya.)

O kwuru na gọọmenti na-ele anya itinye ụfọdụ n'ime ego a napụtara ndị zupuru ego Naijiria n'ọrụ ndị a.

Lee akwụkwọ ndepụta ahụ n'uju ya:

Image copyright @FMICNigeria
Image copyright FMIC
Image copyright @FMICNigeria
Image copyright @FMICNigeria