A ga-eme nyocha DNA iji mata ndị ụkọchukwu Katọlik mụụrụ nwa

Popu Francis Image copyright Getty Images

Otu ụlọọrụ na mba Kenya akpọkuola ụmụnwaanyị niile na-ebo ndị ụkọchukwu ebubo na ha tụwara ha ime ka ha bịa mee nyocha n'aka ha iji chọpụta ma ebubo ọ bụ eziokwu.

Otu ụlọọrụ nọrọ onwe ya na-eme nyocha DNA na Nairobi, na-ekwu na ọ bụ otu ụka Katọlik gwara ha mee nyocha ahụ.

Ndị ga-apụta maka nyocha ahụ ga-enwe ohere ka e belata ego ha ga-akwụ maka nyocha ndị ahụ.

E nyere ụlọọrụ ahụ abalị iri atọ iji mecha nyocha ahụ ma zigara ụka Katọlik ihe mpụtara nyocha ahụ ndị ga-ekwuzị ihe ha ga-eji ya me.

E nwela akụkọ ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik ndị mebiri nkwa ịnọrọ onwe ha na enweghị mmekọ ọbụla, tụwa nwaanyị ime, ma gbahapụ ha na nne ha.

Ụfọdụ n'ime ha agaala ụlọikpe, ebe ọtụtụ na-ekwu ya na nzuzo.

N'otu akụkọ, e nwere otu ụkọchukwu a na-ebo ebubo na o gburu ụmụaka abụọ ndị ọ mụtara iji gbochie ka a ghara ịmata arụ ọ kpara.

N'izu gara aga, onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Popu Francis kwuputara na ụka Katọlik emeghị ihe ọbụla maka mmetọ ndị ụkọchụkwụ ha metọrọ ụmụaka ọtụtụ afọ gara aga.

Vatican ekwubeghị ma ụka aga enyere ndị ihe metụtara aka dịka inye nne na ụmụ ego maọbụ ihe iti aka n'obi karịa afọ gara aga oge ha hiwere kọmiti lebara anya na mmetọ na etu diayosisi si eme okwu gbasara ndị ụkọchụkwu imetọ ụmụaka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a