Afọ a na-achọzị ịsagbu ndị mmadụ na Borno?

Afọọsịsa na Borno Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Afọọsịsa nwere ike igbu ụmụaka pii

Ụlọọgwụ niile na-agba ghara ghara ugbua maka ọrịa afọ ọsịsa nke tipuru na Borno steeti.

Akụkọ na-akọ na ihe ruru mmadụ 1,068 na-azọ ndụ ha ka ọ dị ugbua.

Kọmịshọna na ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Haruna Mshelia kwuru na ya bụ ọrịa agbasala okpuru ọchịchị gọọmenti iri na steeti ahụ.

N'ime ndị niile ọrịa metụtara, ọ sị na mmadụ 25 nọ n'ụlọọgwụ Benisheikh, Dala na ọzọ akpọrọ El-Miskin.

Kọmishona Mshelia gbaara ama a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ụrụ ọbara ị dị ọcha nakwa igbochi ụmụ nje na-ebụ ọrịa nọ na mmiri.

Ọ sị na ihe nwere ike ibute ya bụ afọsịsa ebe niile "bụ ị ga mposi ebe ekwesighi ya na gburugburu mmadụ adịghị ọcha ka o sị kwesi, ọkachasị n'ogige ebe ndị gbara ọsọ ndụ".

Ọ sị na "mgbasa ozi maka ịdị ọcha na gburugburu ebe mmadụ bi bụ isi na-ịkwụsị mgbasa ọrịa a" bụ nke tara isi mmadụ 61 n'afọ gara aga.

Ọ sịkwa na onwebeghị onye nwuru site na ya bụ ọrịa ka ọ dị ụgbụa mana naanị otu onye nwugoro n'ime ihe kariri mmadụ nari ọrịa ahụ bituru aka kemgbe afọ a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a