Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ị dị njikere maka idemmiri?

Ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka mgbanwe mbara igwe adọọla ndị bi n'akụkụ mmiri aka na ntị sị ha kwara nwgongwo ha gbaa ọsọ maka idemmiri na-abịa.

Steeti ndị ọ ga-ememtụta bụ Anambra, Delta, Bayelsa, Niger nakwa Kogi.

Ọzọ,

Gọv David Umahi

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi agbachiela ọdọ mmanụ agbidi Dipro n'Ebonyi steeti iji mee nyocha ebubo ire mmanụ Kerosene adịgboroja e boro ha.

Cheta na ụmụaka abụọ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde gara-aga ebe Kerosene adịgboroja esi n'ọdọ mmanụ ahụ zụta gbara ọkụ.

N'Abuja,

Taa ka aka chịburu Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso kwuputara na ya esonyela n'ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa na ntuliaka 2019.

Kwankwaso forola ntutu taa na ya ga-emeri Buhari ebe a kagburu ohere enyere ya iji ọgbọ egwuregwu Eagles Square mee nkwuputa ya taa.

Na mba ofesi,

Angela Merkel

Ebe foto si, Getty Images

Praim Minista mba Jamini bụ Angela Merkel na-akwado ime njem nke ya bịa Naịjirịa ebe ibe ya nke mba Briten bụ Theresa May tụrụ ụkwụ taa na Naịjirịa.

Ọ nọ Abuja ugbua ebe ya na Onyeisiala Muhammadu na-enwe nzukọ imeụlọ.

N'Egwuregwu,

Hal Robson-Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Hal Robson-Kanu onye ọgba bọọlụ Wales esorola ibe ya chilie bootu elu n'ịgbara ala ya bọọlụ.

Robson-Kanu kwuru na o mere nke a inye ya ohere ihazi ezinaụlọ ya nakwa ịgbara otu klụb ya bọọlụ.

Gee Nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile