Theresa May na-abịa Nigeria izute Buhari taa

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Theresa May na-abịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Theresa May na Buhari zuteburu na UK n'ọnwa Epreelụ nke afọ a

Theresa May bụ Praịm Mịnịsta ndị Briten ga-esi mba Saụt Afrịka bata Nigeria taa ebe ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-akpa maka azụmahịa, nchekwa nakwa ịgba mgbere mmadụ.

Ipob

Otu Ipob enyela iwu sị ka ndị Igbo niile na-akwado ha ghara ịpụta ezi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Septemba.

Ebe foto si, Getty Images

Ha chọrọ iji ụbọchị ahụ ruo uju iji gosi iwe ha maka ndị ha sị nwụrụ n'egwu eke ndị agha Naịjirịa gbara n'Afaraukwu dị n'Ụmụahịa nakwa Ngwa, Aba na Port Harcourt, n'ụbọchị ahụ n'afọ gara aga.

Ihe na-eme na Bornu

Afọ na-achọ isagbu ndị mmadụ na Bọrọnu steeti.

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Haruna Mshelia kwuru na ihe karịrị mmadụ puku na-arịa ọrịa afọ ọsịsa, ebe mmadụ iri abụọ na ise nọ n'ụlọọgwụ maka ọrịa a si na mmiri ha na-an̄ụ.

N'egwuregwu,

Roger Federer meriri Yoshihito Nishioka iji banye n'agba nke abụọ n'asọmpi US Open, ebe Caroline Wozniacki meriri Sam Stosur iji gafee.

Ebe foto si, Getty Images

Wozniacki bụ onye abụọ n'ọkwa onye kachasị apịa tenis na mbaụwa ebe Federer bụ onye abụọ n'ụmụnwoke kacha apịa.

Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Atụmatụ nke gọọmenti etiti hiwere iji na-enye ndị ụwa na-atụ puku naịra ise kwa ọnwa ebirila ọkụ n'ebe ụfọdụ na Naijiria.

Aha onyonyo,

Lee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye