DJ Cuppy: O kwuru arụ?
Ndị mmadụ ọ kachasị ụmụ nwaanyị akatọọla Ada ọgaranya DJ Cuppy n'ihi okwu o kwuru na ya abụghịzị Feministi.
N'ime onyonyo ahụ, Cuppy kọwara na ya n'onwe ya aghọtaghị ihe Feminism' pụtara, ya mere na ọ gaghịzị akwado ya bụ echiche.
N'ọnụ ya "anyị kwesiri ị tinye ike anyị n'ihe ga abara anyị uru dịka ị meputa onwe anyị bụ ụmụnwaanyị"
Okwu a amasịghị ụfọdụ mmadụ nke mere n'aha ya malitere iwu ewu na soshal midia Twitter.
@cocomile_ kwuru na ọ pụtara ịmebọ onwe ya n'ihu ọha.
@itschigbo kwuru na o kweteghi ihe DJ Cuppy kwuru.
@slay_targaryen kọwara etu ihe DJ Cuppy kwuru esighi nwe isi.
Ebe ndị ọzọ na-akwado ya...
@ani_nomso si ndị mmadụ chee echiche ọfụma tupu ha akatọọ ya nụ nwata nwaanyị
@oluwapower kwuru na Cuppy si n'ụzọ nke ya akwado ụmụnwaanyị
Ebe @TheNnanna kwuru na ọ bụghị iwu ị kparị DJ Cuppy maka ihe o kwuru
Akukọ ndị ga-amasị gị: