Daniel Achi: 'Ahụrụ m pounds na dọla mana ọ baghị m anya'

Daniel Achi: 'Ahụrụ m pounds na dọla mana ọ baghị m anya'

Otu nwaanyị si ala bekee lọta chezọrọ akpa ya nke ego oyibo, elekereaka, ọlaaka na ọlaolu jupụtara n'ọdọụgbọelu Muritala Mohammed dị na Legọs.

Otu ọrụ nche Halogen security bụ Daniel Achị hụrụ akpa ahụ, wegara ya onyeisi ya bụ Francis Emepuaku.

Ha abụọ nyeghachiri akpa ego bekee ahụ ha tụtara n'ọdọụgbọelu onye nwe ya.

Nwoke gara ịkwọta nwaanyị ahụ ma bụrụkwa enyi di ya aha ya bụ Dkta Banji Oyegbami depụtara ihe mere n'sochal midia.

Nke a mere aha Daniel Achi na onyeisi ya bụ Francis Emepuaka jiri bido wube na Naijiria niile nke n'ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari degara ha ozi ekele maka ịkwụwa aka ọtọ.

Ndị ụlọọrụ ha bụ Halogen tunyere ha ugo, nye ha ego ma bulikwa ha n'ọkwa.

Ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka maka ya na nso nso a.

Lee ihe nkiri a ka ị hụ akụkọ ka o siri mee n'ọnụ ha: