Fọm N55M: Ihe ndị ntorobia na-ekwu maka akwụkwọ ikike PDP na APC

Ndị na-ebinye aka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu na anaghị ebinye aka na ntuliaka 2019

Ọtụtụ ndị ntorobia na-azọ ọkwa ọchịchị dị iche iche na Naịjirịa ka na-ebe akwa maka akụkọ pụtara ụbọchị ole na ole garaaga na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka APC na PDP jiri nnukwu ego na-ere akwụkwọ ikeke otu ha ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala.

Akụkọ a kọwara na otu Peoples Democratic Party na-ere akwụkwọ ikike ha nde naira 12 (12 million naira) nakwa All Progessives Congress na-ere nke ha nde naira 55 (55 million naira).

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ndị ntorobia na-azọ ọkwa ọchịchị na-ekwu maka akwụkwọ ikike otu PDP na APC

BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị ntorobia were ebumnuche iso ịzọ ọkwa ọchịchị nke ala a, ajụjụ ọnụ maka akụkọ a.

Kingsley Okeke Aru bụ onye na-apụta dịka onye omeiwu nta n'ime Anambara steeti gwara onye ntaakukọ anyị na udi akụkọ a na-agbawa obi.

O kwuru na "Udị ihe a bụ ihe na-ebute izu ohi n'ọchịchị ala anyị Naịjirịa, ụdị ihe a anaghị enye ndị ntorobia dịka anyị obi nkwadebe ịzọ ọkwa ochịchị n'ala a"

Chinedu Oyegbula bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Imo steeti gbara ajụjụ ọnụ nke ya. Ọ jụrụ "Biko gwa m, onye wepụtara ụdị ego a maka ị zọ ọkwa ọchịchị, ọ ga-ewepute obi ya niile ruo ọrụ? Onye a ga-aba gọọmentị zuo ohi"

Eunice Atuejile bụ nwata nwaanyị chọrọ ịpụta dịka onyeisiala Naịjirịa gwara onye ntaakụkọ anyị "Udi ihe a bụ ihe na-enye anyị obi ike ị gbam mbọ hụ na-anyị soro n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị a. Akụkọ a pụtara na ruo ugbua ndị na-achị ala Naịjirịa asọghị ka ndị ntorobia tinye aka n'ọchịchị ala a."

Akụkọ ga-amasị gị