Ụlọuka Katọlik daara na Delta akụgbụọla otu nwata

Ụlọ dara ada.

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwata dị afọ 11 anwụọla oge otu ụlọụka akpọrọ St. Paul Catholic Church, Ugolo dị n'obodo Okpe n'ime Delta steeti dara ebe a na-eme ekpere n'ụtụtụ taa.

Ihe mberede a mere n'elekere itoolu nke ụtụtụ a ka ndị mmadụ nọ n'ime ụlọụka ahụ na-ekpe ekpere.

Onyeisi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Mohammed Mustapha gwara BBC Igbo na ụlọụka kara ezigbo nka nakwa na ha eburola ndị pụtara na ndụ n'ihe mberede a gawa ụlọọgwụ.

O kwuru na ugbua ọnaghị enwe ike ikwu ihe mere ụlọ a jiri daa, mana ọ na-eche na ọ bụ maka oteela ha lụrụ ụlọụka a.

N'ọnụ okwu ya: "Ụlọụka a dị afọ 100. Ọ bụ ụlọụka a lụrụ oge ndị ọcha na-achị ala anyị. Ihe a bụ ihe m che mere ka ụlọụka daa mana anyị ka na-eleba anya na mberede a.

Onyeisi ndị sineti Naijirịa bụ Bukola Saraki etinyela ọnụ zigara ndị ihe mberede metụtara ozi itiakab'obi site n'akara soshal midia ya taa.

N'ime ozi ahụ o gwara aka n'achị Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ha dibe ma kwu kwa na ya jisike enweta enyemaka ebe ha nọ

N'ọnụ "anyị ga-agba mbọ ị hụ na ndị ji ndị ha pụta n'ihe a ga-enweta ọgwụgwọ kwesiri ha".

Akụkọ ndị ga-amasị gị: