Ọdọ ụgbọelu Enugu: Gọvanọ ndị ọwụwa-anyanwụ sị na ọnọdụ ya na-agbawa obi

Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu
Nkenke aha onyonyo A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu

Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugwu nọ na ya ugbua.

N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba 2018, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu ka ha bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya.

Onye nọ n'isi oche nzukọ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Davịd Umahi, bụkwa aka na-achị Ebonyi steeti, kwuru ihe a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ihe pụtara na nzukọ a ha mere.

Umahi sị na ọ dị mkpa ka e mezie ebe a na-anabata ngwaahịa na ya bu ọdọ ụgbọelu.

Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu so na ọdọ ụgbọelu nke ụgbọelu si mba ofesi na-ada, mana o nwebeghi ọtụtụ ihe o kwesiri inwe, dịka ọkụ okporo ya, nke ga-eme ka ụgbọelu daa n'abalị.

Na bọọjetị nke 2018, a mapụtara nde naịra narị ise maka ọrụ ọdọ ụgbọelu a.

Cheta na omeiwu Ike Ekweremadu, bụ osote onyeisi ndịomeiwu ukwu Naịjirịa na ndị omeiwu ọzọ si ọwụwa-anyanwụ, tinyere ọnụ n'ebubo onyeisiala Muhammadu Buhari boro ndị omeiwu na ha chabiri ego e kwesịrị iji rụọ ọrụ n'akwa Naịja nke abụọ, ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu, ụzọ Benin-Ọre nakwa ọtụtụ ọru ndị ọzọ ga-abara ndị Naịjirịa uru ma were ego tinye n'ebe ọzọ.

Na nkọwa ya, Ekweremadu kwuru na uche ya na nke ndịomeiwu si ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa dị n'ọdọ ụgbọelu Enugwu so n'ọrụ dị icheiche ndịomeiwu chabiri ego ya.

Ekweremadu kwuru na ọ bụ na ngalaba omeiwu a na-akpọ "committee" n'asụsụ Bekee ka nchabi a mere, ma kwuo na ndị Kọmiti o metụtara gaha agwa ọha ihe mere na etu o siri mee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a