Ndị ọrụ nchekwa sị ka a gba Ipob nkịtị maka okwu 'sit-at-home'

Faulks road Image copyright Emmanuel Izuchukwu
Nkenke aha onyonyo Ụzọ Faulks dị n'Aba mgbe e mere ncheta Biafra

Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa gwara ndị bi na mpaghara ahụ ka ha ghara ige otu n'ime otu chọrọ ka e kewaa Naịjirịa bụ nke Bekee Kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) ntị.

Okwu a pụtara na nzụkọ ndị isi uweojii, ndịagha, ndị DSS nakwa ndị Civil Defence mere n'Akwa, isi obodo Anambara steeti n'ubọchị nke atọ n'ọnwa Septemba, 2018.

Onyeisi ndị uweojii n'Anambara bụ Garba Umar, kwuru na Ipob bụ otu iwu machiri, nke mere ha ejighi nwee ikike inye onye ọbụla iwu.

Umar sị: "Iwu machiri Ipob. Ya mere anyị ji arịọ ọha ka ha ghara ịtụ ụjọ maọbụ kwe ma a kwanye ha ige ndị Ipob ntị. Ha na-akwado ime ka ndị mmadụ ghara ịpụta n'ụbọchị iri na anọ nke Septemba, mana ndị nchekwa dị njikere.

"Anyị na-ekwusi ike ka ndị mmadụ gaa ebe ọbụla ha chọrọ ịga makana anyị ga-ahụ na anyị chekwara ha. Anyị dị nkwadobe maka ihe ọbụla ga-eme."

Cheta na Ipob kpọburu oku ka ndị mmadụ ghara ịga ọrụ maọbụ ahịa n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee maka ncheta Biafra.

N'agbanyeghi na ndị nchekwa gwara ọha ka ha ghara ige ntị, ndị mmadu na ụfọdụ obodo n'ọwụwa-anyanwụ gbachiri nkịtị nọrọ n'ụlọ ha ụbọchị ahụ.

Ọgbaghara dara n'etiti ndị Ipob na ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị 14 nke Septemba n'afọ gara aga butere mmachi Ipob, na itinye aha ha ka otu na-eyi egwu na Naịjirịa.

Mana ọ bụ naanị Naịjirịa kwenyere na mkpebi a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: