Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka China-Africa summit

Ebe foto si, Getty Images
President Xi Jinping say China investment for Africa no get any 'political strings attached'
Ọ rara ahụ ka achọ onyeisiala mba Afrịka anọghị na China n'ụbọchị ato nke ọnwa Septemba 2018 ebe onyeisiala China bụ Xi Jinping nyere ha enyemaka ruru $60,000,000,000 iji rụọ ọrụ mmepe obodo.
Ka Maazi Xi kwuputara ego a China nyere Afrịka na mmalite nzukọ abalị abụọ ya na ndị Afrịka na-eme, mana ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe kpatara ha ji aga China a.
Ijeri dọla iri na ise ($1.15bn) eweputara maka enyamaka sọkwa n'ime ijeri dọla iri isii a na ihe ndị ọzọ ga-esote ya.
Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mba Afrịka na-aga ịna ego na China
N'aka ọzọ, Xi kagbụkwala ego ndị mba Afrịka ụfọdụ jị China.
Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ mba n'Afrịka na-aga China ka irụ ọru ojiegoachọego, dika ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na mba ahụ ga-apụta onyeisi ụwa a.
Nke bụ eziokwu bu na China agafela World Bank na Ọgbako Yurope dị ka mba na-enye Afrịka aka karịa n'ihe banyere mmepe.
Ihe mere Afrịka ji achu China
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Saụt Afrịka na and China presido Xi Jinping
Dịka Larry Madowo, onye bụ editor n'ihe gbasara ego na azụmahịa na BBC Africa kwuru, ọ sị na China kachasị enye ego maka nwulite ngalaba n'Afrịka bụ ihe mere mba Afrịka niile jiri wuchie ọgbakọ China-Africa emere.
Madowo kwuru na n'agbanyeghi na ndị mba Afrịka na-anata mbibi n'aka China, ndị ọkachamara na-atụ egwu na ụgwọ mba ndị ahụ ji China karịrị akarị.
Otu n'ime ndị ọkachamara bụ Cobus Van Staden nke Mahadum Witts kwetara na "Chịna bịara Afrịka ị nweta ego, ya bụ ihe Afrịka chọrọ, mana nsogbu ga-adị ma ọ bụrụ na ha esighi ọtụ ụzọ a gaba".
China achọghị ka Afrịka 'mefuo' ego ahụ
Iji maatụ, mba Yuganda anatala dọla ijeri atọ bụ mbibi mba China n'iji rụ ụgbọ oloko ebe China ka kwere ha nkwa ego ọzọ.
Ebe foto si, Getty Images
African Leader dey poseon Monday wit China Presido Xi Jinping for Beijing
N'agbanyeghị na ndị mmadụ na-atụ egwu na ego a niile nakwa ngalaba dị ịcheiche a na-awulite si China abịa, Onyeisiala mba China bụ Xi Jinping apụtala ịkọwa na ha agaghị akwado "mmefu ego" n'akwa na ha agaghị etinye anya n'usoro ọchịchị ndị obodo ahụ.
O kwuru na ijeri iri isii mba ya nyere Afrịka bụ nke China jiri we kwalite "mwulite ga-emepụta ohere ga-amasị ndị ntorobịa".
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anatala China mbibi dọla nde narị atọ n'ọma iji wulite ngalaba teknụzụ n'obodo ahụ.