Ibrahim Shekarau agbahapụla PDP

Shekarau na Kwankwaso Image copyright @KWANKWASORM
Nkenke aha onyonyo Ndị ma maka ihe mere sị na ọ bụ maka nsogbu dị n'etiti Shekarau na Kwankwaso mee o ji pụọ

Onye bụbụ gọvanọ Kano bụ Ibrahim Shekarau ahapụla PDP.

Shekarau hapụrụ PDP n'isi ụtụtụ taa, dịka onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Maazị Sule Ya'u Sule kwuru.

Shekarau, bụ onye so na ndị na-azọ ọkwa dịka onyeisiala n'okpuru PDP, sị na ọ hapụrụ PDP makana nkata ndị isi pati ahụ na-akpa iji megide ya na ndị otu ya.

Ọzọ metụtara ihe ha sị bụ etu Rabiu Kwankwaso jiri chọọ ịbụrụ onyeisi PDP na Kano.

Na Mọnde bụ ụbọchị nke atọ n'ọnwa Septemba, ọtụtụ ndị PDP mere ngagharịiwe na Kano.

Mana, ndị nke Shekarau kwuru na tupu ha e mee ihe a ha mere, ha na ndị isi PDP mere nzukọ ka ha mara ma a ga-ahazi okwu a na-ese.

Etu ọ dị ugbua, Shekarau ekwubeghi pati ha na ndị otu ya ga-aba.

Shekarau nọbu n'APC, mana ọ pụru tupu e mee ntuliaka nke 2015.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: