Ihe Igbo sọrọ nwaanyị ime

Nwoke na-eche ibe ya ọjị Image copyright Empics

N'omenaala Igbo, nwoke na nwaanyị ahaghị aha n'anya.

A na-agbado ụkwụ ma mmadụ abụ nwoke maọbụ nwaanyị n'ike ọrụ maọbụ oke dịrị onye.

Ụmụnwoke n'agbanyeghị ma ha abụ nwata, karịrị nwaanyị n'ọkwa na ngụkọ dịka omenaala Igbo si dịrị.

Ya mere, o nwere ọrụ maọbụ ohere a mabidoro na nwaanyị enweghị ikike ya nke bụ na nwaanyị nupuru isi n'ihe ndị a 'mere arụ'.

Lee ụfọdụ n'ime ihe ndị nwaanyị anaghị eme:

1.Nwaanyị anaghị arị maọbụ ete nkwụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ala Igbo

N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu nkwụ, elu ọjị maọbụ ọjịị.

Ngawuchu kwuru na nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ihi na nwaanyị esighị ike.

"O nwere ike rịa elu nkwụ, hụ agwọ, egwu ejide ya, ọ daa n'elu."

N'okwu ọkammụta asụsụ Igbo na Mahadum Legọs (University of Lagos) bụ Chigozie Nnabuihe, ọ bụ iji chekwa ugwu nwaanyị.

Nnabuihe kọwara na oge gboo, nwaanyị anaghị eyi akwa na-awachi ahụ nwaanyị nke mere na ọ rịa elu, onye nọ n'ala ga-ahụ ọtọ ya.

2. Nwaanyị anaghị eketa ala obi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị nwere ike inweta ebe ịkọ ubi mana ọ gaghị enwe ikike ire ya maọbụ nye onye ọzọ

N'ala Igbo, nwaanyị anaghị eketa ala obi.

Nkwenye Ndigbo dịka otu okenye, Chukwudi Nganwuchu, siri kọwa bụ na nwaanyị nwere oke naanị na be di ya.

Mana n'ezie, nwaanyị anaghị enweta oke na be di ya ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwoke.

O nwere ike e nye nwaanyị ebe ịkọ ọrụụgbo mana ọ bụghị nke ya n'ezie n'ihi na onweghị ikike ire ya maọbụ inye ya onye ọzọ.

3. Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke, ọ naghị aga agha

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwoke ka ọ dịrị iga agha n'ala Igbo

Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke n'ọgbakọ maọbụ n'agha.

Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuhe sị "O bụ nwoke ka ọ dịrị ichekwa ezinaụlọ ya. Ọ bụ ụmụnwoke ka ọ dịrị ichekwa obodo."

4. Nwaanyị anaghị awa ọjị

Image copyright Empics

Nwaanyị anaghị awa ọjị ebe nwoke nọ.

Ọ bụ naanị oge ụmụnwaanyị gbakọrọ naanị ha ka onye kachasị okenye n'ime ha nwere ike ịwa ọjị mana ọgaghị agọ ya agọ.

Dịka Nnabuihe kwuru, ihe kpatara na nwaanyị anaghị agọ ọjị bụ na ọjị bụ ihe dị nsọ, nwaanyị nwere oge ọ na-anọ na nso; ọ ga-emerụ ọjị.

5. Nwaanyị anaghị ekenye nwa di

Image copyright @igboweddings

Nwanyị anaghị anọ ebe a na-ekwu akụ nwaanyị ọ masị ya, ya bụrụ na di ya anwụọla.

Nnabụihe sị "Ọ bụ iji gosi na ọbụghị anụmanụ ka a na-azụ, ọ bụ mmadụ ka a na-alụrụ. Ọ bụ anụmanụ na-anọ ebe a na-ekwe ya ọnụ."

6. Nwaanyị anaghị ata eke ọkụkụ

Image copyright kaffiskitchen
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị ekwesighị iri eke ọkụkọ dịka omenaala Igbo siri dị

Otu okenye aha ya bụ Chukwudi Nganwuchu gwara BBC Igbo na ihe mere ndị gboo jiri machie nwaanyị ịta eke ọkụkọ bụ na e nwere nkwenye na eke ọkụkọ na-atọ ụtọ ebe ọ dị ukwu nke na 'nwaanyị tara ya ga-ebido gbawa n'ezi.'

Nnabuihe kwuru sị, "Eke ọkụkọ bụ nke nwoke. Akpụrụotule bụ nke ya, isi ya nke diọkpara. Ada nwe ukwu ya. agba dịkwara ada."

7. Nwaanyị nọ na nsọ anaghị esiri onye chiri echichi n'ala Igbo, nri.

Ọ bụrụgodu na di ya bụ onye chiri ọzọ, ọ gaghị eri nri nwaanyị ma ọ nọrọ na nsọ.

Nnabụihe sị, "Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ. Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya."

8. Nwaanyị anaghị alụ nwoke

Nwaanyị enweghị ike lụọ nwoke etu nwoke si aga alụ nwaanyị.

9. N'ekele, nwaanyị anaghị eri aka atọ

Image copyright Nonso Mcginger Ibeneme @mcginger22
Nkenke aha onyonyo N'ekele, nwaanyị anaghị ana aka

Nwaanyị anaghị eri aka atọ maọbụ kwuo 'Igbo kwenu', 'Ndigbo mmammanụ o'.

"Nwaanyị nwere ike ikwu, "Ndị di m ekele m ụnụ o!'"

"Ọ bụghị nwoke niile na-ana aka atọ. Ọ bụ nwaanyị chie elu chie ala, onweghị ike ana aka atọ, abụọ maọbụ otu."

10. Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwụ

Nkenke aha onyonyo Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwu

Agaghị agụchali ihe nwaanyị agaghị emenwu n'ala Igbo mana ọ dị mkpa ma ị mara na ihe ị na-eleda anya na ọbụghị ihe bụ nso: Nwaanyị ekwesịghị ịnụ ike nkwụ n'omenala Igbo.

Nnabuihe sị, "Ọ bụ ihe na-enye nwoke ike ọ ga-eji rụọ ọrụ dịrị ya."

Na nkọwa ya, o kwuru na ọbụghị mmegbu kpatara ndị gboo ji nwee iwu ndị a niile kama na onye ọbụla ma nwoke, nwaanyị na ụmụaka nwere ọrụ ya n'ala Igbo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a