Restructuring: Osinbajo kwuru na Atiku ghọtahiere ya

Osinbajo
Nkọwa foto,

'I tinye anya na mpụ kachasị mkpa'

N'ime akwụkwọ ozi ọ degara ụlọọrụ ntaakụkọ Premium Times, Osinbajo kọwara ihe ndị ọ mere gosiri na ọ kwadoro nhazi obodo pụtara 'Restructuring' na bekee.

Ọ kwukwara na Atiku katọrọ ya maka na o kwuru na "Restructuring' agaghị akwụsị nsogbu ndị anyị nwere n'ala Naịjirịa" mana ihe o bụ n'uche wee kwu ya bụ na ekwesiri ị mata ihe mere steeti ejighi eme ọfụma karịa ịbu nhazi obodo n'isi.

O kwuru na ihe ekwesiri ịtinye anya n'aya ugbua bụ mpụ ego n'arị ibe ya elu mbụ nke pụtara na ndị mmadụ na-aga n'akpa ego ala Naịjirịa ewere ego etu ọ sị sọ ha.

N'ọnụ ya "nhazi obodo agaghị enwe isi maọbụrụ na ndị nọ n'ọchịchị ka na-eme akpaego Naịjirịa ka akpaego nke ha.

Restructuring bụ nhazi obodo bụ okwu ndị ọchịchị ndịIgbo kpụ n'ọnụ kemgbe

Ndị tinyere ọnụ na ya bụ okwu gụnyere Obi n'achị Ọnịcha, Mao Ohabunwa bụ onye omeiwu nakwa Ugo Egbujo bụ onye ọkaiwu.

Lee ihe ha kwuru ebe a.

Akụkọ ga-amasị gị