MTN: Gịnị jikọrọ ha na ndị gọọmentị etiti?

MTN

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ụlọ ọrụ MTN kwuru na ọkaiwu kachasị na Naịjirịa na-enyocha ihe gbasara ha ikwụ ụtụisi

Gọọmentị Naịjirịa adaala MTN nha ụtụisi ruru ijeri dọla abụọ nke kwaturu oke ha n'ahịa oke ụbọchị tusde.

O tebeghi aka ụlọakụ ukwu nke Naijirịa nyere iwu ka ụlọọrụ MTN dị na Legọs weghachite ego ruru ijeri dọla asatọ ha bupuru n'ụzọ daara iwu.

N'akwụkwọ ozi e depụtara iji kọwaa ihe gbasara ya bụ ego ụlọakụ ukwu kwuru na MTN ji asambodo na-akwụghị ọtọ wee zịga ego mba ofesi, MTN kwuru na ha na ndị ọkaiwu kachasị na Naijirịa na-eme nyocha ihe gbasara ịkwụ ụtụisi ụlọọrụ ha.

MTN kwuru na ha akwụọla ihe ruru dọla nari asaa nke kpuchitere ụtụisi a na-ekwu maka ya.

Akụkọ kwuru na kemgbe a machara MTN nha, oke wụturu ọfụma n'ahịa oke kemgbe ụtụtụ Tuusde.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: