Ndị ọrụ ntaakụkọ n'Abia steeti akwala arịrị
Akụkọ kachasị mkpa taa:
Ngagharịiwe ndị ntaakụkọ n'Abia Steeti
Ebe foto si, BCA/Facebook
Otu ndị ụlọọrụ mgbasa ozi nke gọọmentị Abia steeti bụ Broadcasting Corporation of Abia State (BCA) enwetela ọsịsa n'aka gọọmenti Abia site na ngagharịiwe ha mere maka nchabi ụgwọ ọrụ ha.
Ndị ụlọọrụ ahụ kwuru na gọọmenti Abia steeti malitere ịchabi ụgwọọnwa ndị ọrụ ha kamgbe ọnwa Julaị afọ 2015.
Onyeisioche otu jikọtara ndị ọrụ ahụ bụ Nji Joseph kwuru na gọọmentị ekwela nkwa ikwuzu ụgwọ ọnwa ha malite na nke ọnwa Ọgọstụ.
Ndị uweojii anwụchiela onye gbara akaebe ụgha
Ebe foto si, Alamy
Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria
Ndị uweojii agbala otu nwoke bụ Ismail Yakubu n'anwụ maka ịgba akaebe ụgha megide Edwin Clark nke mere ha ji wakpoo ụlọ ya dị n'Abuja.
Yakubu kwuru na onweghi ihe ọjọ o mere, na ọ bụ kepukepu ọ nụrụ ka ọ gwara ndị uweojii.
Na mba ọzọ
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ atọ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ anwụọla ebe ha na-agbanyụ ọkụ na-ere n'ụlọ ogologo dị na Johannesburg na mba Saụt Afrịka.
Otu onye si n'elu daa ma nwụọ, ebe abụọ ndị ọzọ nwụrụ n'ime ụlọ ahụ.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Ndị nchịkọta otu egwurewgwu bọọlụ na Yorupe akpọọla oku ka akachapụ iwu na-asị na inye goolụ n'ọgbọ ndị ọzọ dị mkpa nke akpọrọ 'Away goal' na bekee.
Ha kwuru na iwu a na-eme ka otu egwuregwu bọọlụ na-akpachị ọgbọ ha ma ghara ịgba ezigbo bọọlụ.
Gere nkeji nke taa:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri taa:
Onye ọkaiwu ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Ugo Egbujo ekwuola na e nwere ụzọ kacha mma Ndigbo inweta Biafra ha na-achọ na-alụghị ọgụ ọbụla.
'Restructuring' ka mma karịa referadum