Salisu Yusuf nara aka azụ $1000 ga-akwụ nha $5000

Ebe foto si, Getty Images
Salisu Yusuf kpọ ndị Super Eagles na-agba n'ụlọ gaa asọmpi CHAN n'afọ 2017 ebe ha ruru agba ngwụcha
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Naịjirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) dara Salisu Yusuf nha $5000 ka a chọpụtara na ọ na-ana aka azụ n'isi ndị ọgba bọọlụ.
NFF nyere iwu sị ka Yusuf sepụ aka n'ihe niile gbasara egwuregwu bọọlụ n'ime otu afọ.
Na-erughị ọnwa ole na ole gara aga, BBC African Eye wepụtara ihe nkiri otu onye ntaakụkọ Ghana bụ Anas Arameyaw Anas, sere na nzuzo gosiri ka Yusuf na-ana 'onyinye' puku dọla ($1000), iji hụ na ọ kpọrọla ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ gaa asọmpi mpaghara Afrịka nke 2017.
NFF kwuru na Yusuf ji anya ọcha ya nara ego ahụ; na omume ya mechuru ngalaba ha ihu makana o kwesịrị ịkpazi agwa ọfụma, ọkachasị maka aka o binyere n'akwụkwọ usoro akparamagwa nke dị n'akwụkwọ nkwenye e ji wee ya n'ọrụ.
Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego
Ha kwukwara na mmadụ abụọ e ji megharịa ya anya na a chọrọ ka ọ họrọ bụ Osas Okoro na Rabiu Ali, gaara esonyekwa ndị otu ha gaa ya bụ asọmpi n'agbanyeghi ego ahụ Yusuf narala, maka "ọnatarachi na ịgba ọfụma ha".
N'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara, NFF kwuru na ọ ga-akwụ nha puku dọla ise a dara ya tupu ọnwa atọ agachaa.
Colins Udoh bụbu ọnụ na-ekwuchitere ndị Super Eagles tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter.