Kedụ ihe ndị dị gị oke mkpa ịzọpụta ma e nwee ọdachi?

Ọdachi idemmiri Image copyright Getty Images

E nwee ọdachi dịka ọkụ ọgbụgba maọbụ oke idemmiri, kedụ ihe ndị dị mmadụ oke mkpa ịzọpụta n'ụlọ ha?

Ọtụtụ oge ka ụlọọrụ dịka ndị ọrụ gbatagbata bụ NEMA na-ezisa ozi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị maka ọdachi dịka oke idemmiri nwere ike imebicha ihe na ihe ndị ọzọ.

N'agbanyeghi ịdọ aka na ntị a, ọtụtụ oge ka ihe ndị mmadụ na-ala n'iyi maka amaghị etu a ga-esi mee maọbụ maka atụwaghị anya na ọdachi ahụ ga-eru etu o si ruo.

Ihe na-emezị bụ na ọdachi ahụ mee, ihe ndị dịka ụgbọala, akwụkwọ na-egosi ihe mmadụ nwere nke Bekee kpọrọ 'document', ego, asambodo, ọla dị iche iche na ihe ndị ọzọ na-emebi.

Image copyright Getty Images

Ọdachi dịka oke idemmiri nakwa ọkụ ọgbụgba atakwaala isi ọtụtụ ndị mmadụ.

Ihe ị kwesịrị iwe n'ụlọ n'ọdachi idemmiri

Nnanyelugo Ezeanị bụ onye na-arụ n'ụlọọrụ Nema n' Enugwu, gwara BBC Igbo ihe ndị mmadụ ga-ewe ma ha na-agba ọsọ ndụ n'ụdịrị ọdachi a.

  1. Asambodo (ma nke ị ji gụọ akwụkwọ, maọbụ nke ị ji lụọ nwaanyị nakwa nke e ji mụọ ụmụ gị).
  2. Akwụkwọ ikike ụlọakụ gị, maka na ị ga-achọ ya ma ihe ego dapụta.
  3. Ntupe igodo nke ụgbọala gị nke ị na-edosa n'ụlọ.
  4. Akpa gbatagbata (ya bụ akpa ga-enwe ihe ndị dịka ncha, uwe, ụrị ọkụ latric na ụfọdụ ihe ndị ọzọ) nke ị ga-esere n'aka ozugbo ihe ọdachi dapụtara.
  5. Redio ntakịrị ị ga-eji na-ege ntị ịnụ etu ọnọdụ dị.
  6. Akara ekwentị ndị gbata gbata.

Lee ihe mbuze na-eme n'ala Igbo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMbuze achụpụla ndị mmadụ n’ụlọ ha na Nanka

Lee ihe ndị mmadụ zara oge BBC Igbo jụrụ ha ihe ha ga-eme ma ha nwee ụdịrị ọdachi a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara