2019 Election: Etu ndị mmadụ si nabata ndị ntorobịa ịzọ ọchịchị

Ebe foto si, Ndị na-azọ ọchịchị
Ebe ụfọdụ kwetara na oge eruola ka ndị ntorobịa banye na ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, ndị ọzọ kwuru na ha hapụ zọọ n'afọ 2023.
N'ime izu ise sitere n'izu mbụ nke ọnwa Ọgọstụ rue izu mbụ nke ọnwa Septemba, BBC Igbo gosipụtara ndị ntorobịa Igbo chọrọ isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2019.
Ụfọdụ ndị mmadụ gosipụtara ọṅụ ha na ndị ntorobịa nwere ọchịchọ ịzọ ndọndọrọ ọchịchị, ebe ndị na-akwado Biafra kwuru sị na ha achọghị ịma, sị nye ha Biafra.
Paul Okoye nke otu P-Square na-akpọku ndị ntorobịa Naịjirịa
Anambara steeti
Ndị Anambara kacha kesaa akụkọ a, nke pụtara na ọ bụ ya ka ndị mmadụ kacha gụọ.
Mmadụ abụọ chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu ukwu, mmadụ abụọ chọrọ ịbanye n'ụlọomeiwu nta, ebe mmadụ isii chọrọ ịnọchite anya ndị obodo ha n'ụlọomeiwu nke steeti.
Gụọ ya n'uju ebe a: 2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịnọchite anya ndị Anambra n'ọchịchị
Ha tinyekwara ọnụ n'okwu a na soshal midia.
Enugwu steeti
Ndị Enugwu bụ ndị abụọ kachaa kesaa akụkọ gbasara ndị ntorobịa si steeti ha chọrọ ịzọ ọchịchị. Ọ pụtara na ha nwere mmasị ebe ha nọ?
Otu onye pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, otu onye chọrọ ịbanye n'ụlọomeiwu ukwu ebe mmadụ ise chọrọ inweta oche n'ụlọomeiwu nke steeti.
Gụọ ya n'uju ebe a: 2019 Election: Ndị Enugu lee ndị ntorobịa chọrọ ịnọchite anya unu
Lee ihe ndị Enugwu mere gbasara akụkọ a na Facebook:
Imo steeti
Ndị Imo steeti bụ ndị nke atọ na ndị kesara akụkọ a. Ọ pụtara na ha kwadoro atụmatụ ndị ntorobịa ịnọ n'ọkwa ọchịchị?
Otu onye chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu ukwu, mmadụ abụọ chọrọ ịnwa ike ha ịzọta oche n'ụlọomeiwu nta, otu onye chọrọ ịnọchi Rochas Okorocha n'oche gọvanọ, ebe mmadụ abụọ chọrọ ịzọta oche n'ụlọomeiwu nke steeti.
Gụọ ma hụ ha n'uju ebe a: 2019 Election: Ndị a chọrọ ịnọchite anya ndị Imo steeti
Ebonyi steeti
Ebonyi gbara onye nke anọ na ndị gụrụ akụkọ nke ha nke ọma. Ọ bụ ndị ntorobịa ga-eweta mgbanwe ahụ ha na-achọ?
Otu onye chọrọ ịbanye n'ụlọomeiwu ukwu, otu onye chọrọ ịbakwa na nke nta, ebe mmadụ atọ chọrọ ịzọta oche n'ụlọomeiwu nke steeti.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: 2019 Election: Lee ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịnọchite ndị Ebonyi steeti
Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ndị ntorobịa Ebonyi na Facebook
Abịa steeti
Ndị ntorobịa enwere olileanya ịzọta ọchịchị n'Abịa?
Mmadụ abụọ chọrọ ịzọta oche n'ụlọomeiwu nta, otu onye na-achọ ịhụ ma ọ ga-achụpụ Okezie Ikpeazụ n'oche gọvanọ, ebe mmadụ anọ chọrọ ịzọta oche n'ụlọomeiwu nke steeti.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:2019 Election: Ndị Abia lee ndị chọrọ inochi anya unu
Ị nabatara atụmatụ a? Ndị ntorobịa etozuola inweta ọkwa ọchịchị na Naịjirịa etu ọ dị ugbua?