Anambra: Mmiri enweghi onye iro abụghị maka idemmiri

Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Ụfọdụ oge, mbuze na-eji nwayọ nwayọ gosi onwe ya ma ụkpụrụ ya tupu ọ kpaa ike mana ụfọdụ oge, ndị mmadụ anaghị eleba ya anya.
Oke idemmiri gbawara ụzọ si Ụmụawụlụ, Nibo, Ọgbụ aga Ọka dị n'Anambara steeti mara ọkwa ogologo oge tupu o wee gbawa ụzọ mana ekele dịrị chukwu na onweghi onye ọ tara isi ya.
Mana lee etu o si bido
Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Mmiri hapụrụ ụzọ a waara ya n'ọwa dị n'okpuru ụzọ a tinye isi n'akụkụ ọwa ahụ bido ịwachapụ aja dị n'okpuru ụzọ ahụ.
O buru ụzọ guo olulu a, mana onweghi onye mere ihe ọbụla.
Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Mmiri ga-achọtarịrị ụzọ ebe o si aga ma ọ bụrụ na o nwee ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ.
Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Ide mmiri na-eji iwe na ọnụma na-abịa oge ọbụla, nke mere o ji ebu ihe niile dị n'ụzọ ya. Ụdị mmiri na-awụ n'ahụ aja nwereike ịwụchapụ aja na ntabi anya buru ma ụlọ.
Ebe foto si, Chukwuma Okpala
Idemmiri a buru ụgbọala a dị n'ime ya
Ihe malitere dịka obere olulu bụ ihe gbawara ụzọ abụọ etu a, gbochie ụgbọala niile kwesiri ị ga n'ụzọ ahụ agaghị agali.
Ndụ ndị Ụmụwụlụ na obodo ndị ọzọ nọ n'akụkụ ha abụbeghi otu kamgbe idemmiri ahụ kewachara ụzọ ahụ.
Onye nkwuchite otu obodo Ụmụawụlụ bụ Chukwuma Okpala gwara BBC Igbo na ya bụ ihe ọdachị emela ha nwịị maka na o metụtara akpa ha.
N'okwu ya, 'Ebe anyị na-ejibu naanị naịra iri ise aga, anyị na-ejizi narị naịra abụọ aga ya, agbanyeghi na ụzọ ahụ dị ogologo karịa ma dịkwa njọ maka ndị ọjọọ na-anọ na ya.
"Ịga ụzọ ahụ bụkwa ihe ize ndụ maka na ọ bụghị ebe ndị mmadụ na-agakarị."
Okpala kwuru na o metụtakwara azụmahịa ha maka na ndị obodo ha na-akọ ugbo anaghị agalizi Ọka ị ga ree ihe ha kọtara ma ndị mmadụ si okpuru ọchịchị ndị ọzọ abịa ahịa ebe ahụ anaghị abaịalizi.
O kwuru na nke a mere na ndị ọrụugbo ha anaghị eritazi elele nkeọma maka na ha na-esi n'imi akwụ ụgwọ ụgbọala ga-akwọga ha ahịa site n'ogologo ụzọ ọzọ.
Kama o toro gọọmenti Anambara steeti maka ọrụ ha bidoro ozigbo ebe ahụ iji hụ na e kpochiri ya bụ olulu kewara ụzọ ha.
Ebe foto si, Chukwuma Okpala
N'akụkụ nke ya, kọmịshọna na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti bụ michael Okonkwo kwuru na ha na-etinye uchu ịhụ na e meziri ụzọ ahụ ka ụgbọala nwee ike na-aga na ya.
O kwukwara na ha na-eti mkpu ka ndị mmadụ kpachara nya maka oke mmiri ozuzo na-abịa nakwa ide mmiri ebe o kwuru na ha na gọọmenti etiti nakwa ụlọakụ mbaụwa na-ejikọ aka ọnụ ịhụ na e lebara anya na nsogbu mbuze na idemmiri na-eme na steeti ahụ.
Ebe foto si, Chukwuma Okpala