Ebumọnụ ụbọchị 40 egbuola nwata Naịjirịa

Titilayo na Kehinde Omosebi

Ebe foto si, Reedsburg Police Department

Nkọwa foto,

Titilayo na Kehinde Omosebi na-eme ebumọnụ ụbọchị 40

Nwoke Naijiria nwa ya nwụrụ dịka ya na ezinaụlọ ya na-eme ekpere na ebumọnụ abalị 40 ekwuola na ihe mere ha jiri banye ebumọnụ abalị 40 bụ na ha na-atụ anya "ngozi n'aka Chukwu."

Ndị uweojii mpaghara Reedsburg dị na Wisconsin nke mba Amerịka nwụchiri nwoke aha ya bụ Kehinde Omosebi na nwunye ya bụ Titilayo maka ọnwụ nwa ha nwoke dị afọ 15 n'ihi oke agụ.

N'akwụkwọ mkpesa nke BBC Igbo natara ndị uweojii mba ahụ, Kehinde gwara ndị uweojii na ihe kpatara ha jiri eme ebumọnụ ahụ bụ na "ha na-eche ngozi sị n'aka Chukwu."

Omosebi na ezinaụlọ ya bidoro ebumọnụ ahụ n'abalị 19 nke ọnwa Julai, afọ 2018, ebe nwa ha nwụrụ ụbọchị ụka bụ abalị 31 nke ọnwa Ọgọstụ, ụbọchị ngwụcha ebumọnụ ahụ.

Ndị uweojii kwuru na na ọ bụ Kehinde Omosebi jiri aka ya bịa kpesara ndị uweojii na nwa ya nwụrụ.

Ndị uweojii gara n'ụlọ nwoke ahụ bụ ụkọchukwu n'ụlọụka a kpọrọ,'Corner Reformation Ministries', gbawa ụzọ n'ihi na e jiri igodo kpọchie ya n'ime,were chọpụta na nwunye nwoke ahụ na nwa ha ọzọ dị afọ 11 nọkwa n'ọnụ ọnwụ dịka ha tara ahụ n'ihi oke agụụ.

Ha kpọgara nwunye nwoke ahụ aha ya bụ Titilayo Omosebi na nwa ha ahụ ụlọọgwụ mana nwaanyị ahụ jụrụ nleta n'ihi okpukpere chi ya.

N'ajụjụ ọnụ ha gbara ya ka ọ natatụrụ nleta nwata ahụ gwara ndị uweojii na ọ bụ nnanị mmiri ka ha nụrụ n'abalị 40 ahụ ha mere ebumọnụ.

Ndị uweojii nwetakwara n'ụlọ ha akwụkwo ozi gbatagbata nwata ahụ degara ndị ụlọikpe sị, " Agụụ akarịala. Bikonụ gbata nyere m aka ka m rie nr.

"Ọ bụrụ na m gaa n'ihu na-erighị nri e nwere m ike ịnwụ n'agụụ."

Ndị uweojii gara n'ihu nwụchie ya na di ma buga ha ụlọmkpọrọ.

'Ha kọwara," A nwụchiri Kehinde na Titilayo, nne na nna mụrụ ụmụaka ahụ ma buga ha ụlọmkpọrọ 'Sauk County' ebe a gbara ha akwụkwọ maka ịgbahapụ nwa ha nke mere ka nwa ha nwụọ nakwa maka ịgbahapụ nwa ha mee ka o merụọ ahụ ebe ọ dị ukwu."

Ikpe ahụ ga-amalite ma ndị uweojii mechaa nyocha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: