APC Imo chọrọ ntuliaka imeụlọ mmadụ ga-anọchite ibe ya

APC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

ọgbaghara dị n'ime APC Imo steeti kemgbe ha mere ntuliaka imeụlọ ọnwa ole na ole gara aga

Otu APC n'Imo steeti kwuru n'ụbọchị Toozde na ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ọchịchị niile maka afọ 2019 abụghị ndị niile a họpụtara ga-eso eme ya, kama ọ bụ ụfọdụ ga-anọchị anya ndị ọzọ.

Nke a bụ atụmatụ a na-akpọ 'indirect primaries' na Bekee ebe a ga-ahọrọ n'ime ndị nnochiteanya (delegates) ndị ga-eso mee ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ọchịchị niile.

Otu kewapụtara na pati ahụ fọrọ ntutut taa na ha agaghị ekwe na ya bụ atụmatụ ma ncha.

Ha kwuru nke a oge ha mechara nzukọ mberede nke imeobi steeti ahụ nke onyeisioche APC na steeti ahụ bụ Dan ọkafọr nọ n'isi ya.

Ndị ọzọ nọ na nzukọ ahụ bụ Uche Nwosu bụ onye chọrọ ọkwa gọvanọ nakwa onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Achọ Ihim

Na mkparịtaụka BBC na otu onye nwere agba na APC Imo steeti bụ Ogueri Isiguzo nwere n'ekwenti, o kwuru na ndị na-akpa nkata 'indirect primaries' a bụ ndị otu gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Rochas Okorocha, na ọ bụghị ebumnobi otu APC niile na steeti ahụ.

Isiguzo gara n'ihu jụọ sị, "Kedụ ka otu onye ga-esi wepụta ndị ga-azọ ọkwa na aha pati? Pati bụ okwu nkwekọrịta ndị nọ n'ime ya."

Ndị nọ na nkewapụta otu APC ndị akwadoghị nnọchite ibe na ntuliaka ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị n'aha pati APC gụnyere onye bụbụ osote gọvanọ bụ Eze Madumere, Emeka Nwajiụba, Sinetọ Ben Uwajumogu, Jasper Azuatalam na Osita Izunaso na ndị ọzọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: