Leah Sharibu anọọla ụbọchị 200 n'aka ndị Boko Haram
Akụkọ kacha mkpa taa
Leah Sharibu anọọla ụbọchị narị abụọ naka Boko Haram
Nwaakwụkwọ Dapchi
Taa mere ya abalị narị abụọ ndị Boko Haram tọọrọ Leah Sharibu bụ onye ha jụrụ ihapụ maka na o kwenyere n'okpukpere Kraịst.
N'ihi nke a, onye enyemaka Goodluck Jonathan n'oge gara aga bụ Reno Omokri na ndị ọzọ si mba Briten emeela ngagharịiwe na Lọndọn.
Ndị Pati APGA kpatarala akwụkwọ ntuliaka
Ebe foto si, Chimezie Ucheagbo
Nwunye Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu bụ Bianca Odumegwu-Ojukwu esorola na ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na ntuliaka na-abịa.
Bianca gara n'akara Facebook ya taa ikwupụta nkwado otu a kpọrọ 'Friends of Ambassador Bianca Odumegwu-Ojukwu' nyere ya.
N'aka nke ọzọ onye ji aha pati APGA zọọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti n'afọ 2015 bụ Alex Otti agbatala akwụkwọ ịzọ ọkwa gọvanọ ọzọ na ntuliaka afọ 2019.
Akụkọ si mba ofesi
Ebe foto si, Reuters
Mba India ehibela iwu nyere ohere maka mmekọrịta nwoke na ibe ya nakwa nwaanyị na ibe ya ma kwuo na ọ bụghị mpụ n'ala ha.
Ikpe a nke ụlọikpe kachasị ukwu ha kpebiri kachapụrụ iwu megidere mmekọ a site n'ikpe e kpere n'afọ 2013.
N'egwuregwu
Ebe foto si, @NGSuperEagles
Super Eagles so n'otu n'asọmpi Iko Mba Ụwa
Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Gernot Rohr akpọpụtala mmadụ anọ ọhụrụ ga-esonye ndị Super Eagles gbaa asọmpị ha na-abịa abịa.
Ndị a gụnyere Samuel kalu, Semi Ajayi, Jamilu Collins na Kelechi Nwakali.
Nkeji nke abalịa
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri ga-amasị gị n'abalịa
Nwaanyị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa akọwala ihe mere o jiri na-ewu na twitter n'izuụka ole na ole gara aga. Gee ihe o kwuru.
Eunice Atuejide Feminist.
Atụmatụ ahụike
Gọọmentị etiti amapụtala ijeri naịra isii maka atụmatụ ahụịke ga-ekpuchite ndị Naịjirịa(National Health Plan) afọ ise.
Ebe foto si, Getty Images
Minista Ahụike bụ Isaac Adewole, kwuru na ọ bụrụ na e mee atụmatụ ahụ dịka o kwesịrị, ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị na-anwụ n'ịmụ nwa ga-ebelata ma daruo pasentị iri atọ na otu.
Akụkọ mere na mba ofesi
Agụụ egbuola nwata Naịjirịa na mba Amerịka,
Nwata dị afọ iri na ise nwụrụ dịka o soro nne na nna ya bụ Kehinde na Titilayo Omosebi n' ekpere na ebumaọnụ ụbọchị iri anọ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A nwụchiela nne na nna maka ọnwụ nwa ha n'ihi ebumọnụ ụbọchị 40
N'akụkọ ọzọ,
Ala ọmajijiji egbuola mmadụ abụọ ebe a ka na-achọ ihe ruru mmadụ iri anọ, n'obodo Hokkaido dị na Japan.
Ebe foto si, EPA
Cheta na oke ifufe gburu ọtụtụ mmadụ ma mebisia ụlọ na ihe ndị ọzọ n'ofu mba Japan a ụnyaahụ.
N'egwuregwu,
Novak Djokovic apịapụla John Millman n'asọmpi US Open.
Ebe foto si, Getty Images
Ọ ga-ezute Kei Nishikori n'agba ọkara-ikpeazụ.
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a.
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri ga-amasị gị taa:
Ndị na-ere ahịa n'ụzọ Douglas dị n'Owere na-arịọ gọọmentị ka a bịa kpochapụrụ ha atịtị na-anọchiri ha ụzọ.
Atịtị Douglas Road