Ị ma na iwu Naịjirịa machiri nwaanyị ịrụ ọrụ n'abalị?

Ihe na-egosi mwakpo mmadụ n'ike Image copyright Getty Images

N'ime afọ ole na ole ugbua, anya ụmụnwaanyị ebidola imepe ebe ịmata ikike dịrị ha n'iwu Naịjirịa nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ha dị.

N'agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnwaanyị kwenyere n'ihe a kpọrọ 'feminist movement', e nwere ụfọdụ iwu dị na Naịjirịa bụ ọgbatughie nye ya.

Nnanna Emeka bụ onye ọkaiwu, so n'otu ndị bu okwu femịnisti a n'isi na Naịjirịa makana ọ gụrụ 'Feminist Jurisprudence' na mahadum.

O kwuru na ọ na-awụ ya akpataoyi ịhụ ndị na-aghọtaghị na e nwere ụfọdụ iwu na-ekpuchiteghị ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

Lee ihe ndị o dere na soshal midia gbasara iwu ndị ahụ:

1. Nwoke nwere ike iti nwunye ya ihe

N'okpuru ọkara 55 (d) nke 'Nigeria Penal Code' nke metụtara di na nwunye lụrụ n'okpuru iwu omenala, nwoke nwere ike iti nwunye ya ihe ka ụmụaka ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị emerụ ya ahụ ga-ebuga ya ụlọọgwụ.

N'agbanyeghị na iwu a ka dị rue ugbua, Naịjirịa wepụtara iwu a kpọrọ 'Violence Against Persons Prohibition Act' n'afọ 2015.

Iwu a megidere ụdịrị mwakpo dị iche iche; onye dara ya nwere ike inweta ntaramahụhụ tara akpụ.

2. Nwaanyị ekwesịghị ịrụ ọrụ n'abalị

Ọkara 55 nke iwu 'Nigerian Labour Act' anaghị ekwe ụmụnwaanyị rụọ ọrụ n'abalị belụsọ na ọ bụ nọọsụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agba akwụna n'abalị na Naịjirịa

Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahụta ya na iwu a ga-eme ka ụmụnwaanyị ghara ịkpata ego etu kwesịrị ekwesị, mana Olamide Abe na-agụ maka iwu na mahadum, gwara BBC na iwu na-ekpuchite ụmụnwaanyị.

O kwuru na etighị iwu a ka e megide ụmụnwaanyị.

3. Iwakpo ụmụnwaanyị n'ike abụghị nnukwu mmehie

N'ime ọkara 353 nke iwu 'Nigerian Criminal Code', iwakpo nwoke ọbụla bụ ezigbote mpụ, e nwere ike ịtụ gị mkpọrọ afọ atọ.

Image copyright Reuters

Mana n'okpuru iwu a, iwakpo nwaanyị n'ike abụghị nnukwu mpụ, ntaramahụhụ ya akarịghị ịnọ afọ abụọ n'ụlọmkpọrọ.

4. Nwoke mba ọzọ enweghị ike ịbụ onye Naịjirịa site n'ịlụ nwaanyị Naịjirịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaanyị si mba ọzọ nwere ike ịbụ onye Naịjirịa site n'ịlụ nwoke Naịjirịa

N'okpuru ọkara 26 na 27 n'iwu Naịjirịa, naanị nwoke nwere ike isi n'alụmdinanwunye mee onye mba ọzọ onye Naịjirịa, nwaanyị enweghị ike ịnwa ya anwa.

5. Nwaanyị ekwesịghị ike nwa ya di maọbụ nwaanyị

Onye ọbụla na-erughị afọ 21 chọrọ ịbanye n'alụmdinanwunye ga-anata akwụkwọ ikike n'aka nna ya. Naanị ihe ga-eme ka nwaanyị dee akwụkwọ ikike ahụ bụ ma ọ bụrụ na di ya anwụọla maọbụ ọ bụrụ na isi mgbaka na-eme ya.

Iwu a dị n'okpuru ọkara 'Nigerian Marriage Act'.

6. Ọ bụghị njọ ma nwoke wakpoo nwunye ya n'ike

Ọkara nke isii nke 'Nigerian Criminal Code' na-akọwa na iwakpo nwaanyị ị lụrụ alụ abụghị mpụ.

Dịka iwu a si kwuo, enweghị etu nwoke si awakpo nwunye ya n'ike maọbụ nwaanyị si awakpo di ya n'ike.

Image copyright Getty Images

Olamide Abe kwuru sị na iwu a adịghị mma makana ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụshi anya maka mwakpo ndị ha lụrụ na-eme ha.

Dịka ndị feministi ndị ọzọ, Nnanna chọrọ ka e tinye iwu ga-ekpuchite ma nwoke ma nwaanyị, ma tinye uchu ịhụ na ndị mmadụ mere iwu ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEunice Atuejide Feminist.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a