Nwunye Ojukwu bụ Bianca ga-azọ ọkwa sineti na Anambra South

Ebe foto si, Bianca Odumegwu Ojukwu/Facebook
Bianca bụ nwunye dike duru ndị biafra gaa agha Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu
Nwunye Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu bụ Bianca Odumegwu-Ojukwu esorola na ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na ntuliaka na-abịa.
Bianca gara n'akara Facebook ya taa ikwupụta nkwado ahụ otu a kpọrọ 'Friends of Ambassador Bianca Odumegwu-Ojukwu' nyere ya.
O kwuru na ha wuchiri n'isi ụlọọrụ otu pati APGA ma gbatara ya akwụkwọ isonye na ntuliaka ime ụlọ a ga-eme iji kwado maka ntuliaka sineti n'afọ 2019.
Bianca kọwara na ndị otu ahụ kpokọrọ onwe ha ọnụ ma tụkọọ egọ ha gbaara ya akwụkwọ ahụ nke o kwuru gosiri nkwado pụrụiche.
O kwuru na nkwado a gosiri na ndị mmadụ nabatara ya nkeọma agbanyeghi nsogbu ọ na-enwebu na mbụ ebe obodo ndị di ya kwuru na ọ gaghị azọlị ọchịchị n'ala ha maka na ọ bụghị onye ala ahụ.
N'okwu ya na Facebook; "Ihe a na-aga n'ihu na-egosi ụdị nnabata ndị okpuru ọchịchị Anambara Saụt nwere n'ebe ọ nọ nakwa ụdị agụụ ha nwere ka ọ nọchịte ha n'ụlọomeiwu sineti.
Ebe foto si, Bianca Odumegwu Ojukwu/Facebook
Nke a pụtara na Bianca ga-azọ ọchịchị n'Anambara steeti bụ ala di ya
"Maka ụdị amamihe o nwere site n'ọrụ ya dịka onye nnọchite anya mba Naịjirịa n'ebe dị icheiche, ọ rara ahụ ndị Anambara inweta ụdị mmadụ tozuru ka ya ịnọchite anya ha na sineti."
Akụkọ apụtala na mbụ na ndị Anambara ekweghi ka nwunye Ojukwu zọọ ọchịchị na steeti ahụ maka na ọ bụ onye Enugwu steeti a lụbatara n'Anambara.