Ụzọ e si ama ndị na-egwu mmadụ changum
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Lee etu ị ga-esi gbalarị ndị 419

Dịka akụkọ ịghọnarị ndị mmadụ ego ha nakwa akụnaụba ha na-arị ibe ya elu na Naịjirịa nakwa mbaụwa, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC nke Enugwu steeti akọwala ụfọdụ ụzọ e si agbalarị ndị a.

N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara Chris Oluka, o kwuru na ụzọ e ji amata ndị a na-ara ahụ maka na ha na-eke ajị n'ume n'ihe ọbụla ha na-eme:

1. Mmadụ kpọọ gị n'ekwentị maka ihe nrite pụrụ iche

I kwesiri ịjụ onwe gị ajụjụ sị, " Kedụ mgbe m ji debanye aha maka ụdị ihe nrite ahụ?" nke a ga-enyere gị aka inyocha ozi maọbụ oku dị etu ahụ.

2. Ọtụtụ ndị a na-eji aha onye ọzọ maọbụ foto ndị ọzọ egwu ndị mmadụ chandum

Nyocha onye zitere gị ozi ahụ na ụdị enyi o nwere n'akara Facebook, Instagram nakwa Twitter dịka

Oluka kwuru n'ime nyocha, ọ bụrụ na ị maghị onye dị etu ahụ, ka ị ghara ịnabata ozi onye ahụ ma o zitere gị.

3. Ha chọrọ izitere gị ego maọbụ ihe onyinye

4. Mmadụ zitere gị ozi gị gwa gị na ya bụ ụlọakụ gị, gị zitere ya BVN gị

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara