#FreeZakzaky: Elzakzaky anọọla abalị 1000 n'aka ndị DSS
Akụkọ dị mkpa taa:
Tọghapụ Elzakzaky
Ebe foto si, IMN
Sheikh Ibrahim Zakzaky
Ndị nkwado onyeisi ndị Shiite bụ Ibrahim Elzakzaky pụtara n'igwe n'okporoụzọ Abuja taa, na-akpọ oku ka atọhapụ ya dịka ha na-echeta ụbọchị otu puku ọ nọọrọla n'ọnya ndị DSS.
Anwụchiri Elzakzaky kamgbe afọ 2015 dịka eboro ya ebubo na ogburu ndị agha bụ nke ikpe ya ga-abụ ọnwụ.
Ọ bụghị Alaọmajiji mere n'Abuja - FEMA
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ gbatagbata nke Abụja bụ FEMA akatọọla akụkọ na-ekwu na alaọmajijiji mere n'Abuja.
FEMA kwuru na ọ bụghị alaọmajijiji kama na ọ bụ mgbawa okwute nakwa ọrụ ndị na-egwupụta ihe n'ala kpatara nke a.
Onye ụkọchukwu a onwere ọdaeshi?
Ebe foto si, Anambara Police Command
Otu ụkọchukwu akpọrọ David Chidiebere kwuru na ya gbanahụrụ ọnwụ mgbe ndị ojiegbe wakporo ụgbọala ya ma wụkwasị ya egbe mana mgbọ egbe atụghị ya n'ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na Chidiebere gwara ya na nke a mere n'ụzọ si Udi gawa Enugwu.
Ebe foto si, Anambra police command
Akụkọ si mba ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu mba Briten arịọla ndị na-eji ụgbọelu ha eme njem mgbaghara maka mwakpo ndị na-eji igwe Kọmputa ezuohi mere ụlọọrụ ahụ bụ nke metụtara ọbaego ndị ahụ.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Manchester United akwụsịla mkparịta ụka maka ọdịnihu ha na onye otu ha bụ Paul Pogba kwuo na odochaghị anya ma nwamadị ahụ ọ ka chọrọ ịgbara ha bọọlụ.
Cheta na akụkọ na-ekwu na Pogba nwereike ị hapụ Manchester United gawa Barcelona n'ọnwa Jenụwarị nke afọ na-abịa abịa.
Nkeji nke abalịa
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Iwu ntuliaka 2019
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị na gọomentị ekwuputala ụjọ ha na 2019 agaghị aga n'ụzọ ziri ezi etu o kwesịrị.
Ebe foto si, Getty Images
Ụjọ ha bụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ikwenye ka a gbanwee iwu ntuliaka nke 2019, dịka ha na-ekwu ka ndị ụlọomeiwu etiti gbaa mbọ kuziere ndị Naịjirịa ihe gbasara iwu a.
Uweojii nke steeti
Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Femi Falana ekwuola na nhazighari e mere SARS agaghị egbo nsogbu ọrụ ndị uweojii na nchekwa Naijiria.
Ebe foto si, Getty/AFP
Falana, onye kwuru na mkparịtaụka o nwere na Channels TV ụnyaahụ ka e nwee ndị uweojii nke steeti sịrị na o nweghị mba a na-enwe naanị ndị uweojii etiti.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:
Na mba ofesi,
Ebe foto si, Reuters
Ndị obodo Idlib na-eji akụrụngwa awarawa ekpuchi imi ka ha na-atụ anya mwakpo kemịkal a
Amerịka ekwuola na ha nwere ọtụtụ ihe akaebe doro anya na-egosi na gọomentị Syria na-akwado ịtụpụta ngwaagha kemịkal n'obodo Idlib.
N'egwuregwu,
Serena Williams gosiri na ọ kajara akaja dịka ọ pịapụrụ Anastija Sevastova n'ọkara-Ikpeazụ nke asọmpi US Open.
Ebe foto si, Getty Images
Serena ga-ezute Naomi Osaka n'agba ikpeazụ, ebe ọ ga-abụ o merie, o rite nzere 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya.
Nkeji taa
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri ga-amasị gị
Eunice Atuejide na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 apụtala ịkọwa ọnọdụ ya gbasara okwu 'Feminist' o kwuru wuru ewu na soshal midia.
Eunice Atuejide Feminist.