US Open: Serena Williams ọ ga-erite nzere Grand Slam nke 24 ya n'afọ a?

Serena Williams Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Serena zutere pịapụrụ Venus nwanne ya n'agba nke atọ iji banye agba nke anọ na US Open 2018

Serena Williams abanyela n'agba ikpeazụ nke US Open nke 2018, mana ajụjụ onye ọbụla ugbua bụ "ọ ga-ebulinwu iko ahụ"?

Williams dị afọ 36 meriri Anastasija Sevastova dị afọ 28 iji gafee ma banye agba ikpeazụ nke asọmpi tenis ahụ.

Ọ ga-ezute Naomi Osaka dị naanị afọ 20, ebe ọ ga-achọ igosi ụwa na ọ ka zuru ka e mee dịka ọ mụchara nwa otu afọ gara aga.

Williams nwetara ohere imezu nzere 'Grand Slam' ya 24 n'asọmpi Wimbledon na 2017, mana Angelique Kerber pịapụrụ ya n'agba ikpeazụ.

Mana ugbua ohere ọzọ pụtara, ọ ga-emezunwu ya etu Margaret Court si mee nke ya 24 n'afọ 1994?

O bulie iko nke afọ a, ọ ga-abụ onye kacha gbaa afọ nweterela nzere 'Grand Slam' n'egwuregwu tenis ụmụnwaanyị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Serena pịpụrụ Anastasija Sevastova iji banye agba ikpeazụ

Navratilova nwetara nke ya oge ọ dị afọ 37, ebe ọ ga-afọ ụbọchị 16 ka Serena dịrị afọ 37 ma o merie.

Agba ikpeazụ a Serena ruru bụ nke 31 ọ na-eru na 'Grand Slam' ma bụrụ nke US Open itoolu ọ na-eru.

O buligo iko US Open ugboro isii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara