Lọghachitenụ na Naịjirịa maka ihe adịla mma - Gọọmenti

Ndị Minista Naịjirịa n'oge idu ha n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti arịọla ụmụafọ Naịjirịa niile nọ na mba ofesi ka ha lọta bịa nye aka rụzie Naịjirịa na ihe adịla mma.

Minista nka na ụzụ bụ Ogbonnaya Onu rịọrọ arịrịọ a n'aha onyeisiala Buhari n'ime ọtụtụ ọgbakọ ya na ụmụ Naịjirịa bi na mba Amerịka mere.

Ebe ọ kuziri ha maka iwu ọhụrụ onyeisiala Buhari tinyere aka na ya bụ nke metụtara nka na ụzụ.

Ọ gwara ndị a na ụzọ ochie eji eme ihe enyela ohere ka ụzọ ndị ọhụrụ were ọnọdụ.

Onu gara n'ihu kelee ndị Naịjirịa bi na mba ofesi maka ego ha na-akwụbata kwa afọ bụ nke ọnụ ego ya ruru ijeri dọla iri abụọ na abụọ. kwuo na ọ bụ oke ihe ntụnye nye Naịjirịa " mana anyị chọrọ ka unu lọta ụlọ".

N'okwu ya " Biko anyị chọrọ ka unu lọghachite n'ụlọ, ọ dị mkpa. Ọbụghị mmadụ niile ga-alọta mana ụfọdụ nwereike ịmalite ịlọghachite, ọ bụ uru ya."

Ebe foto si, @NGRPresident

"Anyị na-agwa unu na ihe agbanwela, ọ bụ ozi anyị , ọ bụ ya mere m ji bịa."

"N'eziokwu, onweghi etu ị ga-eji gbanwee ihe niile ma mee ya nke ọma n'otu ntabi anya. Ihe kachasị mkpa bụ na e nwere mgbanwe."

O kwuru na Naịjirịa nwere ụfọdụ ndị kachasị n'amamihe n'ụwa niile.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Etu e si agbanarị ndị changum