MTN: CBN ewepụla ijeri naira ise ego nha ha dara ụlọakụ

Godwin Emefiele

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria

Ụlọakụ etiti bụ Central Bank of Nigeria(CBN) na bekeee, ewepụla ego karịrị ijeri naira ise n'ego ụlọakụ atọ na Naijiria.

Ụlọọrụ akụkọ Reuters kwupụtara na CBN wepụrụ ego karịrị ijeri naira ise n'ego ụlọakụ Citigroup, Standard Chartered nakwa Stanbic IBTC.

Ha kwuru na a napụrụ ụlọakụ CitiGroup ijeri naira 1.2; Standard Chartered ijeri naira 2.4, ebe Stanbic IBTC gwara ụlọ azụmahịa Stock Exchange na a kụpụrụ ha ijeri naịa 1.8.

CBN wepụrụ ego a ka ha dachara ụlọakụ anọ nha ijeri naira 5.87 iji taa ha ahụhụ n'ihi aka ha dị n'ebubo na MTN bupụrụ ego na Naijiria n'ụzọ megidere iwu.

Cheta n'izu gara aga, CBN dara MTN nha maka ibupu ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri dọla 8.134 n'ụzọ ezighị ezi, ma dakwa ụlọakụ anọ nha maka inyere ha aka mee nke a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: