Ụzọ ọjọọ dị n'ala Igbo
N'ime inyocha ụzọ nke BBC Igbo mere, anyị chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụzọ n'ime ụzọ anọ gbara Owere gburugburu ndị anyị gara bụ nke gọọmenti etiti nwe ka dị mma.
Nke a bụ ụzọ si Owere gawa Onicha, mana a bịa n'ụzọ si Owere gawa Portharcourt, ihe ruru kilomita iri abụọ adịghị mma chacha bụ nke na-akpabeghi aka n'ime ọtụtụ afọ gara aga.
Nke a mere ndị ọkwọụgbọala na-agba ụzọ ahụ ji ebe akwa, na-arịọ gọọmentị etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
N'ụzọ Ụlakwọ, nke si Owere gawa Aba, anyị hụrụ ngwaọrụ ndị na-arụ ụzọ mana o nweghị ndị mmadụ na-arụ ụzọ anyị hụrụ.
Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na o ruela ọnwa isii ndị ọrụ a bidoro ikewa ụzọ ahụ abụọ.
Nke si Owere gawa Umuahia ka nwere ọtụtụ ebe na-adịghị mma.
Otu onye ọkwọụgbọala kwuru na ọ karịala ihe ruru afọ iri na isii a rụrụ ọrụ n'ụzọ ahụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Lai Mohammed : Ọ bụghị eziokwu na gọọmenti etiti enweghị ihe o mere n'ala Igbo
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed agọọla n'ebubo kwuru na o nweghị ihe ọchịchị Muhammadu Buhari mere Ndị Igbo.