Boko Haram akpachiela obodo ọzọ na Borno steeti

Ebe foto si, Getty Images
N'ime elekere ole na ole ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha gbasara ndị Boko Haram nọ n'ime ọhịa Sambisa, ndị Boko Haram pụtara n'ike ma wakpo obodo ọzọ.
Ndị a wakporo obodo Gudumbali dị na Guzamala nke Borno steeti n'ụtụtụ taa, chufuo ndị agha nọ n'ebe ahụ ma kpachie ọgbe ha.
Ndị agha ọdịnala gwara ndị ntaakụkọ AFP na ihe ruru mmadụ asatọ nwụrụ na mwakpo aahụ emere.
Boko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ
Mwakpo na-abịa dịka gọọmenti kpọrọ oku ka ndị niile achụpụrụ lọghachite n'obodo ha.
Onye ọrụ ọchịchọ obodo Guzamala kwuru na mwakpo a bụ eziokwu ma kwuo na ndị jizi ọchịchị obodo ahụ ugbua.
Otu onye ọrụ nchekwa onye agha kwuru ndị a bara n'elekere asatọ nke abalị ụnyaahụ ma gbasuo ndị agha egbe rute n'isi ụtụtụ taa, bụ nke mere ndị agha jiri gbaa ọsọ.
Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọ maghị mmadụ ole ha gburu na mwakpo ahụ.
Onye obodo akpọrọ Musa Ari kwuru na ọ bụ ndị agha ka ndị Boko Haram a bịara ịwakpo na ọ bụghị ndị bi n'obodo.
Ari kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ ka ha gburu bụ ndị na-agara ndị agha ozi.