Ndị nwoke na-akpagbu anyị na ndọrọndọrọ - Ụmụnwaanyị

Ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụnwaanyị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Kogi steeti ekwuola na ndị gbo ha ụmụnwoke na-anapụ ha ohere ịzọ ọkwa ọchịchị nakwa akpachikọrọ ọkwa niile.

N'okwu ha gwara ndị ntaakụkọ na Lokoja, ha kwuru na ndị nwoke na-eji ụmụnwaanyị eme ndị mbinye aka na-enyeghi ha ohere ịzọ ọkwa ọchịchị.

Nwada Kemi Oluyori bụ onye zọburu ọkwa ụlọomeiwu ndị Kogi steeti kwuru na enyeghi ya ohere dịka nwaanyị isonye na ntuliaka ime ụlọ nke pati ya mere.

"Mgbe m kwupụtara uche m ịzọ ọkwa n'afọ 2014, ndị ụmụokoroọbịa bịara n'ụlọ m n'ime abalị ahụ ị dọ m aka na ntị maka nke a. Ha ṅụrụ iyi imechu m ihe maka m chọrọ ịzọ ọkwa."

Oluyori kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha gbaa mbọ tụnyere nwaanyị ibe ha n'otu ọkwa ọchịchị iji wee kwuchite ọnụ.

Otu nwaanyị akpọrọ Bisi Abejide kwuru n'ọtụtụ oge a na-akwagide ụmụnwaanyị n'ike ịtụnyere onye ọbụla di ha na-akwado n'ọchịchị.

Aha onyonyo,

Eunice Atuejide Feminist.

N'aka nke ọzọ, otu nwaanyị chọrọ izọ ọkwa ụlọomeiwu nta bụ Aderemi Adebowale kwuru na ụmụnwaanyị ka ndị nwoke mma n'ọchịchị.

O kwuru na ụmụnwaanyị ga-enye ndị Naịjirịa ntuziaka ọhụrụ tara ọchịchị.

N'ọkwụ ya "Ihe ọbụla nwoke na-eme, nwaanyị ga-eme ya karịa."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: