Lee ihe mere Imo steeti ji ewu ewu n'izu a.

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Rochas achụọla ndị ọrụ ya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha na ndị pati ya bụ APC na enwe ọgbaagha n'Imo steeti

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha azaala n'ọrụ mmadụ 13 bụ ndị ọrụ ya ọ sị na ha chọrọ ịsonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.

Sam Onwuamedo bụ odeakwukwọ mgbasa ozi ya tinyere aka n'akwụkwụ ozi ejiri zisaa ya bụ ozi.

Ọkụ ga-adị ma ụnụ tinyere m akwụkw 2019

Image copyright AP
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari kwere nkwa na ọkụ latrik ga-adị gbanyuu ma ọchịwa na 2015

Onyeisiala Buhari ekwusiele ike na ya ga etinye anya na ụkwọ ọnwa ọpeketempe ndị ọrụ ma ya lọhachite na ọchịchị.

Ọbụ sịnatọ Ita Enang bụ ojeozi ya na ihe gbasara ụlọọmeiwụ gwara ndị nta akụkọ nke a.

UN sị sị nyochaa Rodrigo isi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rodrigo Duterte malitere ịchị Phillipine n'afọ 2016

Otu na ahụ ma ikike dịrị onye na United Nations ekwuola na-ekwesiri inyocha isi aka na achi Phillippines maka ajọ agwa ọkpara.

Rodrigo Duterte gụnyere onye ọrụ UN bụ Victoria Tauli-Corpuz na ndị omekataraihepuujo ndị mba ahụ nyere ndị ụlọikpe ha.

Asompi ọkaibe ụmụnwaanyị amalitela na Urop

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Asompi ọkaibe ụmụnwaanyị malitere na afọ 2001

N'egwuruegwu, nke na-akpọtụ tata bụ champions legue nke ụmụnwaanyị.

Ị chọọ ịmata ka ihe siri kwụrụ na ya lee asọmpị ụmụagbọghọ bụ nke malitere kemgbe elekere atọ tata.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ

Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Dasuki Galandanchi nyere ịdọ aka na ntị a oge ya na ndị nchekwa ndị ọzọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Owere.

Galaanchi rịọrọ ka ndị mmadụ gawa mkpa ha ụbọchị ahụ ghara irube isi nye iwu ndị IPOB ahụ.

Ipob tiri iwu ahụ iji cheta ndị tufuru ndụ ha oge ndị agha Naịjirịa gbara 'Egwu Eke' na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n'afọ 2017.

Ohaneze ndị Igbo arịrọla ka Ndigbo nọrọ na steeti ebe ha bi tụọ vootu na ntuliaka na-abịa na 2019.

Onyeisi Ohaneze na Niger steeti bụ Emmanuel Ezeugo rịọrọ atụmadụ ndị bi na mpaghara ugwu ka ha nọrọ na steeti ghara ịgba ọsọ.0

Naịjirịa

Ọkaiwu ukwu Naịjirịa ma bụrụkwa mịnịsta na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ bụ Abubakar Malami ebela akwa arịrị maka ọnụọgụgụ ndị na-eche ikpe nọ na nga.

Image copyright Abubakar Malami/ Facebook

Malami kwuru na ọ bụ ihe anya mmiri na ndị na-eche ka e kpee ha ikpe bụ ihe mere pasentị iri asaa ndị nọ na nga na Naịjirịa.

Na mba Ofesi

Onyeisiala mba Tanzania bụ John Magufuli agwala dị na nwunye ka ha ghara ime ihe ga-akwụsị ha ịmụ nwa kama ka ha na-amụ na-aga.

Image copyright Reuters

Magafuli kwuru na ọ bụ ndị ume ngwụ na-akwụsị ịmụ nwa nke merela na ọnụọgụgụ ọtụtụ obodo na mpaghara Yurop adaala.

O kwuru okwu a n'ihu onye ọrụ mba un na-ahụ maka iwebilata ọmụmụ na Tanzania bụ Jacqueline Mahon nakwa mịnịsịta ahụike ha bụ Ummy Mwalimu.

Tanzania nwere mmadụ nde 55.7 wee na-achụ nde 60 ọsọ

Akụkọ ebe ndị ọzọ

Otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ World Health Organisation (WHO) na Bekee ekwuola na nkwụgbu onwe abụrụla ihe abụọ na-ebute ọnwụ na mbaụwa niile.

Image copyright Getty Images

Ha kwuru na ọnwụ nkwụgbu onwe butere ọnwụ mmadụ puku narị asatọ (800,000) n'etiti ndị dị malite n'afọ 15 rue afọ 29 n'afọ 2016.

WHO kwuru nke a taa iji cheta ụbọchị e wepụtara iji kwụsị ọnwụ nkwụgbu onwe n'ụwa ebe ha kwuru na ndị mmadụ na-egbu onwe ha karịa na mba ndị gbalitere mana ọtụtụ ndị na-egbu onwe ha bụ oge ha na-aganiga ihe siri ike.

N'egwuregwu

Onyeisiala mba Tanzania bụ John Magufuli agwala dị na nwunye ka ha ghara ime ihe ga-akwụsị ha ịmụ nwa kama ka ha na-amụ na-aga.

Image copyright Getty Images

Magafuli kwuru na ọ bụ ndị ume ngwụ na-akwụsị ịmụ nwa nke merela na ọnụọgụgụ ọtụtụ obodo na mpaghara Yurop adaala.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

FRSC adọọla ndị ọkwọọ ụgbọala n'Ebonyi aka na ntị

Image copyright FRSC/twitter
Nkenke aha onyonyo Federal Road Safety Coorp.

Ndị ọrụ Federal Road Safety Kọmishọn adọọla ndị bị na Ebonyi steetị aka na ntị na ha ga amalite inwụchị ma taa ndị kpọrọ ekwo-nkụ na ha agaghị etinye igwe eji akwụsịnata ụgbọla ọke ọsọ akpọrọ Speed Limiter na Sụpịrịsụpịrị.

Onye nchịkọta ha na steetị ahụ bụ Stella Uchegbu kwuru na nke a dị mkpa iji chekwa ndụ ndị na-eme njem n'ọnwa mba a anyị nọ n'ime ya.

Akwusịla ịgbawa okwute n'Abuja

Image copyright Getty Images

Gọọmentị etiti akwusịlatala ịgbawa okwute n'akụkụ ebe ọmajijiji mere na Mpape, Abụja.

Minista na-ahụ maka ihe egwuputere n'ala bụ Abubakar Bawa Bwari mere nke a iji nye ohere ka ndị komiti ehibere maka ịnyonye anya n'ihe butere mbuze ahụ rụchaa ọrụ ha.

Na mba ofesi, aka akparala onye meruru mmadụ ahụ na Paris

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na France

N'ofesi, ndị uweojii ekwuola na mmadụ asaa meruru ezigbo ahụ n'aka otu nwoke ji mma na mgbọrọ na mba France.

Anwụchiela ya bụ nwaamadị nke ha sịrị na o sị mba Afganistan were bata mba ahụ.

N'egwuruegwu

Serena Williams apụọla na US Open

Image copyright robertdeutsch-usatodaysports
Nkenke aha onyonyo Serena bụ Ezenwaanyi na Tenis

N'egwuruegwu, Naomi Osaka nke Japan apịapụla Ezenwaanyị Serena Williams mkpụrụ ọkwụrụ n'anya na US Open.

Serena kparịrị onye ogbu opi egwuruegwu ahụ maka aka enwe ọ sị na ya hụrụ na bụ ofe bụ nke adara ya nha maka ya bụ mkparị.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Lee ihe nkiri anyị taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a