Onye bụ Charles Ogbu m ga-eji saa ya okwu? - Femi Adesina

Charles Ogbu

Aha Charles Ogbu nọ n'ezi ọzọ.

Ugbua ọ bụghị ezigbo oku ka a na-akpọ ya.

A na-akpọ ya maka akwụkwọ ozi o zigara onyeisiala Muhammadu Buhari bụ nke o tinyere n'akwụkwọ ntaakụkọ Sahara Reporters.

Isiokwu Charles Ogbu na ya bụ akwụkwọ bụ maka ihe Buhari kwuru na mgbe ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na otu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCharles Ogbu sị na Onyeisiala bụ odibo ndị Naịjirịa

BBC kpọtụkwara Charles Ogbu sị ya waara anyị ya bụ ikoro eze.

N'ozi ya, onyeisala Buhari kwuru na agaghị ekwe ịdịnotụ Naịjirịa ọnụ.

Ṅ'ime ya, Buharị kpọrọ ndị Naịjirịa "my dear citizens", bụ nke gbarụrụ Charles Ogbu afọ nke mere o jiri chetere onyeisiala na ọ bụ ojeozi ndị ọ na-achị nke bụ na o kwesiri ịkpọ ha "fellow citizens" na bekee.

Charles sị na ụdị okwu ahụ gosiri mpako onyeisiala Buhari.

Charles Ogbu dere ọtụtụ ihe na ya bụ akwụkwọ ozi o degara onyeisiala Buhari.

Leekwa ya ebe a ma bekee.

BBC Igbo kpọtụkwara Femi Adesina bụ ojeozi n'ihe mgbasara mgbasaozi nke onyeisiala Buhari ịmata ma ọ hukwara ya bụ ozi .

Lee ihe ọ sara:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFemi Adesina si na onweghị ihe Charle Ogbu pụtara ị sa ya okwu.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a