Moghalu enwetala ikikie ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha Young Progressive Party

Kingsley Moghalu Image copyright @MoghaluKingsley
Nkenke aha onyonyo Kingsley Moghalu bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ

Moghalu awapụtara na ntuliaka imeụlọ pati ahụ mere n'Abuja na nsonso a.

Moghalu nwetara vootu 243 in'ime 253 ndị nnochite anya (delegates) bịara maka ntuliaka ahụ.

Onye ọgbọ ya na ya na-azọ ọkwa ahụ na YPP bụ Donald Igwegbu rituoro ya, sị na obụghị n'ihi na ya etozughị kama na ebumnuche ya na Moghalu bu otu.

N'okwu nnabata ikike ịzọ n'aha YPP dịka onyeisiala, Moghalu kwuru na oge eruola ka akwụsị ịla ihe n'iyi, nrụrụaka, na amaghị eme n'iile dị Naijiria.

"Ndị be anyị ga-ahọrọ na etiti nnwereonwe na ịgba ohu n'okpuru ndị ndọrọndọrọ ọchịchị tarala nchara n'ime ndọrọnchọrọ ọchịchị nakwa ndị nrụrụaka dị n'ọbara; n'etiti ụbịam na ọganihu ndị ogbenye na ndị enweghị ọrụ; n'etiti udo na nkwụdosi ike ala Naijiria."

Cheta na Moghalu, onye bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ rụbụrụ n'ụlọọrụ mbaụwa bụ United Nations.

Akụkọ ga-amasị gị: