EFCC: Kalu abịaghị zara ọnụ ya n'ụlọikpe

Orji Uzor Kalu Image copyright Orji Uzor kalu

A kwụsịtụrụ ikpe a na-ekpe Orji Uzor Kalu n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs maka ebubo nrụrụaka ego dị ijeri naịra atọ na ụma maka na Kalu abịaghị n'ụlọikpe n'ihi njem nleta ahụike ya.

Kalu na onye bụbu kọmishịọna na-ahụ maka ego n'Abia Steeti bụ Ude Udeogo nakwa ụlọọrụ Kalu bụ Slok Nig. Ltd ka ndị EFCC boro ebubo izu ego gọọmenti Abia Steeti.

Kalu bụ onye pati APC gọrọ na onweghi ego ọbụla o zuru dịka emechara gbapụta ya.

Na mmalite ikpe nke taa, onye ọkaiwu Kalu bụ Gordy Uche rịọrọ ụlọikpe a maka Kalu na anọghị n'ụlọikpe kwuo na Kalu gara mba Jamịnị maka ịwa ahụ.

O kwuru na njem ahụike ahụ nke o kwesiri ime n'ọnwa Ọgọstụ bụkwanụ nke ụlọikpe nyere ya ikike adabaghị dịka Kalu ahughị ụgbọelu ga-ebu ya e mee njem ahụ n'oge.

"Onye nwe m, lekwa akwụkwọ na-egosi mkpatị njem ahụ bụ nke bu aha na akara ekwentị onye dọkịta na-awa ya ahụ."

Image copyright EFCC
Nkenke aha onyonyo Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ

Onye ọkaiwu EFCC bụ Rotimi Jacobs gbarụrụ ihu n'oku ịkpatịkwu ikpe ahụ kwuo na ohere enyere ime njem a gaala.

"Onye nwe m, nke a bụ ịma usoro ikpe a njakịrị nke bụ ihe akpachara anya na-eme."

Ọkaikpe Mohammed Idris n'ikpe ya kwuru na ihe mere eji nye Kalu ohere ime njem ahụike bụ maka etu o si abịa ụlọikpe kwa mgbe.

O kwuru "Agbanyeghi etu onye ọbụla ha n'obodo, onweghi onye karịrị iwu na-achị obodo, anyị ga-eso iwu na-achị obodo n'ikpe a. Onye bịara n'ụlọikpe ga-akwụwa aka ya ọtọọ."

"Akọwaghi nke ọma ihe mere ọ bịaghị ụlọikpe nke taa, ya mere akagbuola arịrịo ya."

Ọkaikpe a buru ikpe a gaa n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Seputemba, 2018.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: