#Nike: Kaepernick akpanyela ọkụ n'ịntanet

mmachi Nike Image copyright Getty Images

Dikaa ụfọdụ ndị ọcha ndị Amerịka ji iwe agba ak[ppụkpọukwu Nike ha nwere ọkụ ji gosi iwe ha ebe Nike nọ, ụlọrụ ahụ na-emepụta akpụkpọụkwụ na ngwahịa egwuregwu ndị na-aga ahịa dịka akara ọkụ.

Ihe butere iwe nke mere ndị Amerịak jiri ịnụọ iyi #Nikeboycọtt bụ na ụlọrụ ahụ jiri onye ọgba bọọlụ ama maka ikwugide ịkpa oke agbụrụ nakwa mwakpo ndị uweojii bụ Colin Kaepernick mee ozi azụmaahịa.

Iwe nke a mere ka onyeisi obodo(Mayor) Louisiana machie ngwahịa egwuregwu ndị Nike n'ụlọ egwuregwu dị na mpaghara ahụ.

Mayor a bụ onye a kpọrọ Kenner Ben Zahn nke atọ gwara ndị otu booster clubs ka ha kwụsi ịzụ na iyi uwe ndị ụlọọrụ Nike mepụtara.

Ozi si n'akwụkwọ ozi ahụ, o kwuru na uwe ọbụla ndị otu a ga-eyi bụ nke onye Diretọ na-ahụ maka egwuregwu ga-etinye aka na ya.

ụfọdụ ụlọakwụkwọ machịkwara ihe ọbụla si n'aka Nike.

Mana dịka nke a na-eme, ngwahịa egwuregwu sị Nike bidoro rewe ka akara ọkụ n'elu intanet.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi a,

Onye a kpọrọ starttoday kwuru na ọ ga-amalite inwe mmekọ n'ebe Nike nọ.

Tish Peariman jụrụ na ọ bụ Mayor ga-ekpebi ihe ndị obodo chọrọ?

Dufu Rigamaroll kwuru ga-achụpụ onye Mayor ahụ tupu ọmachie ntuliaka.

Isiokwu Ndị Emetụtara